Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jenesis 1:1
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jenesis 1:1
Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa.
N’ọnọdụ ya
1Na mmalite Chineke kere eluigwe na ụwa.
2Ụwa bụ ihe na-enweghị ụdịdị ọbụla, bụrụkwa ihe tọgbọrọ nʼefu. Ọchịchịrị gbara nʼelu ogbu mmiri dị omimi. Mmụọ nke Chineke na-erugharị nʼelu ogbu mmiri ahụ.
3Mgbe ahụ Chineke kwuru sị, “Ka ìhè dị,” ìhè dịkwara.
4Chineke hụrụ na ìhè ahụ mara mma. Ọ kpara oke nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
N’asụsụ Bekee
Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke. Ya na Chineke nọ site na mbụ. E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya.Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị onye kere eluigwe sịrị, ọ bụ ya dobekwara ihe niile nʼọnọdụ ha. Ọ bụ ya, bụ Chineke, onye zubere ma kee ụwa, tọkwaa ntọala ya. O keghị ụwa ka ọ tọgbọrọ nʼefu, kama ọ bụ ka e biri nʼime ya ka o ji kee ya. Ọ sịrị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị.“Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, kwesiri ịnara otuto, na nsọpụrụ, na ike. Nʼihi na gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa site nʼọchịchọ gị ka e ji kee ha, ma meekwa ka ha dịrị ndụ.”Ọ sịkwara, “Na mmalite, Onyenwe anyị, ọ bụ gị tọrọ ntọala ụwa, eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya. Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, ọ bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu.Nke a bụ ihe Chineke bụ Onyenwe anyị kwuru, onye ahụ kere eluigwe niile, onye gbasapụkwara ha, onye gbasapụkwara ụwa nʼihe niile nke si nʼime ya apụta, onye na-enye ndị niile bi nʼime ya ume, na-enyekwa ndị na-agagharị nʼime ya ndụ.Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike