Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Maika 6:8
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Maika 6:8
Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
N’ọnọdụ ya
5Ndị m, chetanụ ihe Balak eze Moab zubere na ihe Belam nwa Beoa zara ya. Chetanụ njem unu site nʼobodo Shitim ruo obodo Gilgal, ka unu hụ nzọpụta nke Onyenwe anyị.”
6Gịnị ka m ga-eji bịa nʼihu Onyenwe anyị, ịkpọ isiala nʼihu Chineke onye dị oke elu? M ga-eji onyinye aja nsure ọkụ bịa nʼihu ya nke e ji ụmụ ehi gbara otu afọ chụọ?
7Ọ ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ, bụ ọtụtụ puku ebule, ya na iri puku mmanụ na-asọ dịka iyi? Aga m eji nwa mbụ m chụọ aja njehie m, maọbụ mkpụrụ nke ahụ m chụọ aja maka mmehie nke mkpụrụobi m?
8Nʼihi na o gosila gị, gị mmadụ, ihe dị mma. Gịnịkwa bụ ihe ahụ Onyenwe anyị na-achọ nʼaka gị, Ọ bụ na ọ bụghị ikpe ziri ezi, na ịhụ ime ebere nʼanya, na iji obi dị umeala soro Chineke gị na-eje ije?
9Gee ntị! Olu Onyenwe anyị na-ada na-akpọku ndị obodo ahụ, nʼezie, ịtụ egwu gị bụ inwe amamihe. “Nụrụnụ olu mkpanaka na Onye hiwere ya.
10Ọ ga-abụ na m ga-echezọ akụ ị kpara nʼụzọ na-ezighị ezi, gị ụlọ ajọ omume, ya na ihe ọtụtụ nke na-erughị eru unu ji ere ahịa, bụ nke abụrụ ọnụ?
11M ga-asị onye na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ azụ ahịa, na onye bu akpa nke ihe ọtụtụ aghụghọ dị iche iche juru nʼime ya na aka ya dị ọcha?
N’asụsụ Bekee
He has shown you, O man, what is good. And what does the LORD require of you but to act justly, to love mercy, and to walk humbly with your God?Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ugbu a, Izrel, gịnị ka Onyenwe anyị Chineke gị na-ana nʼaka gị ma ọ bụghị ka ị tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke gị, jee ije na nrube isi nye ya, ịhụ ya nʼanya, na iwere obi gị niile na mmụọ gị niile fee ya ofufe, na ilezi anya debezuo iwu na ụkpụrụ Onyenwe anyị, ndị m na-enye gị taa, nʼihi ọdịmma gị.Ime ezi omume na ihe ziri ezi ka Onyenwe anyị na-anabata karịa ịchụ aja.Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja, ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.Ma Samuel sịrị, “Ihe na-atọ Onyenwe anyị ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụ dịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta? Nrube isi dị mma karịa ịchụ aja ịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule.Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile, mee ka ha ji dịrị? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ, ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.Nʼikpeazụ, nweenụ otu mmụọ, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu, na-ahụrịtanụ onwe unu nʼanya, nwekwanụ obi ọmịiko na obi dị umeala.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike