Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Timoti 4:8

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Timoti 4:8

Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Timoti 4

N’ọnọdụ ya

5nʼihi na-esitere nʼokwu Chineke na ekpere doo ya nsọ.

6Ọ bụrụ na ị mee ka ụmụnna mara ihe ndị a, ị ga-abụ ezi onyeozi Kraịst Jisọs, onye a zụlitere nke ọma site nʼeziokwu nke okwukwe, na ezi ozizi nke ị gbasoro.

7Atụfula oge gị nʼịrụ ụka rụrụ arụ banyere akụkọ ifo nzuzu, na akụkọ na-abaghị uru nke ndị agadi nwanyị na-akọ. Kama zụọ onwe gị ka ị bụrụ onye nke na-asọpụrụ Chineke.

8Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma kama ịbụ onye nke Chineke bara uru karịa nʼụzọ ọbụla, nʼihi na nkwa dị nʼime ya bụ banyere ndụ dị ugbu a na ndụ dị nʼihu.

9Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka a nara ya nke ọma.

10Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ na-ahụjukwa anya maka na anyị tụkwasịrị olileanya anyị na Chineke dị ndụ, onye bụ Onye nzọpụta mmadụ niile, karịchasịa, nke ndị niile kwere ekwe.

11Ndị a bụ ihe ndị ị ga-akụzi, kwudosie ike na-akụzi ha.

1 Timoti 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 Timothy 4:8For physical exercise is of limited value, but godliness is valuable in every way, holding promise for the present life and for the one to come.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Mat 6:33Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
1Tm 6:6Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere.
Abụ 37:3–4Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ. Ka ihe Onyenwe anyị tọọ gị ụtọ. Ọ ga-enyekwa gị ihe niile bụ ọchịchọ nke obi gị.
Ilu 19:23Ịtụ egwu Onyenwe anyị na-eweta ndụ na ọṅụ, na nchebe site nʼihe mmerụ ahụ.
Ilu 22:4Obi umeala bụ egwu Onyenwe anyị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
Kọl 2:21–23“Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”? Iwu ndị a niile na-ekwu banyere ihe ndị ga-ala nʼiyi mgbe a na-etinye ha nʼọrụ, ha sitere nʼiwu na ozizi nke mmadụ. Nʼezie, iwu ndị a yiri ihe e ji amamihe guzobe, nʼihi ụzọ o si akwali mmụọ mmadụ nʼife ofufe dị ka ọ chọrọ, na iweda onwe nʼala, na ịta anụ ahụ ahụhụ. Ma ha abaghị uru o bụla iji ha gbochie agụụ ọjọọ nke anụ ahụ.
Abụ 37:11Ma ndị niile dị nwayọọ nʼobi ga-eketa ala a dịka ihe nketa ha, ha ga-enwekwa udo dị ukwuu.
Mak 10:30nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike