Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Aịzaya 43:18–19
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Aịzaya 43:18–19
18“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga; unu atụgharịkwala uche unu na ha.
19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu.
N’ọnọdụ ya
15Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Onye nsọ gị, onye kere Izrel, Eze unu.”
16Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ kwara ụzọ nʼime osimiri, nke mere ka okporoụzọ dịrị nʼime oke osimiri.
17Nke na-eme ka ụgbọ ndị agha dị ukwuu, na ịnyịnya pụta, ndị agha na ụsụ ha achịkọtara ọnụ, mee ha ka ha dinaa nʼebe ahụ, ghara ibilitekwa ọzọ, dịka ha bụ ọkụ ogho oriọna e menyụrụ emenyụ.
18“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga; unu atụgharịkwala uche unu na ha.
19Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu.
20Anụ ọhịa niile na-asọpụrụ m, nkịta ọhịa, na enyi nnụnụ niile na-ekele m, nʼihi na emeela m ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi na-asọ nʼala ebe tọgbọrọ nʼefu, nye ndị nke m ihe ọṅụṅụ, bụ ndị m họpụtara.
21Ndị m kpụrụ nye onwe m, ka ha kọsaa akụkọ otuto m.
22“Ma unu akpọkughị m, Jekọb, kama ihe banyere m agwụla gị ike, Izrel.
N’asụsụ Bekee
“Do not call to mind the former things; pay no attention to the things of old. Behold, I am about to do something new; even now it is coming. Do you not see it? Indeed, I will make a way in the wilderness and streams in the desert.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Unu anụla ama m na-agba, hụkwa ka ha na-emezu, ma unu ajụla ikwere na ọ bụ eziokwu. “Site ugbu a gawa, aga m agwa unu ihe ọhụrụ nke m na-agwabeghị unu na mbụ.Lee ihe ochie emezuola ma nke ọhụrụ ka m na-ekwupụta. Tupu ha pụta ìhè ana m akpọsa ha nye unu.”Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha. Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara, meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.“Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie. A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị.Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ. Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri. Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta. Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri; ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya. Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ, nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ, Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ. Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya, ndị nzuzu ajọ omume agaghị ejegharị nʼelu ya. Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ. Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya. E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ. Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya. Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike