Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Jọn 4:8

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Jọn 4:8

Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Jọn 4

N’ọnọdụ ya

5Nʼihi na ndị a si nʼime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ naanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị.

6Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.

7Ndị m hụrụ nʼanya, o kwesiri ka anyị hụrịtaa onwe anyị nʼanya, nʼihi na ịhụnanya na-esi nʼebe Chineke nọ abịa. Onye ọbụla nwere ịhụnanya bụ onye amụrụ site na Chineke, ọ makwara Chineke.

8Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, nʼihi na Chineke bụ ịhụnanya.

9E siri otu a mee ka ịhụnanya Chineke nʼebe anyị nọ pụta ìhè: Chineke zitere naanị otu Ọkpara ya nʼụwa ka anyị nwee ndụ site na ya.

10Nke a bụ ihe a na-akpọ ịhụnanya, ọ bụghị na anyị hụrụ Chineke nʼanya kama na ọ hụrụ anyị nʼanya ma zite Ọkpara ya dịka aja nke juru ya obi maka mmehie niile anyị.

11Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nʼanya, anyị kwesiri ịhụrịta onwe anyị nʼanya.

1 Jọn 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 John 4:8Whoever does not love does not know God, because God is love.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Jọn 4:16Anyị maara ma kwerekwa nʼịhụnanya Chineke nwere nʼebe anyị nọ. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụlakwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nʼime Chineke. Chineke nʼonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a.
Abụ 86:15Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
2Kọ 13:11Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.
Abụ 86:5Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.
Efe 2:4Chineke onye jupụtara nʼobi ebere, maka oke ịhụnanya o nwere nʼebe anyị nọ,
Ọpụ 34:6–7O si nʼihu Mosis gafee na-ekwu na-asị, “ Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Chineke ọmịiko na onye amara, onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, na onye babigara ụba oke nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.”
1Jọn 1:5Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike