Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Kọlọsị 3:17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Kọlọsị 3:17

Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Kọlọsị 3

N’ọnọdụ ya

14Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.

15Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.

16Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.

17Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.

18Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka ọ kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị.

19Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.

20Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.

Ndị Kọlọsị 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleColossians 3:17And whatever you do, in word or deed, do it all in the name of the Lord Jesus, giving thanks to God the Father through Him.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Kọ 10:31Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.
Kọl 3:23Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.
Ilu 3:6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
Efe 5:20Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
1Te 5:18Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
1Pt 4:11Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
1Pt 2:5Unu onwe unu kwa dị ka nkume dị ndụ ka a na-ewu ime ka unu ghọọ ụlọ ime mmụọ, ka unu bụrụkwa ndị nchụaja dị nsọ, ndị na-achụ aja ime mmụọ nke Chineke na-anabata site na Jisọs Kraịst.
Hib 13:15Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike