Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Timoti 4:1
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Timoti 4:1
Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ.
N’ọnọdụ ya
1Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nʼoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nʼime chọọchị ga-esite nʼokwukwe wezuga onwe ha, bụrụ ndị na-agbaso mmụọ nduhie nakwa ozizi ihe banyere mmụọ ọjọọ.
2Ozizi dị otu a na-esite nʼihu abụọ nke ndị ụgha, bụ ndị eji igwe ọkụ da nwụọ akọnuche ha.
3Ndị dị otu a na-egbochi ịlụ dị na nwunye na iri ihe oriri ụfọdụ. Ma ọ bụ Chineke kere ihe oriri ndị a ka ndị kwere ekwe, ndị maara eziokwu ahụ jiri ekpere na ekele nara ha.
4Ihe niile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe ọbụla a ga-ajụ ma ọ bụrụ na e jiri ekele nara ya,
N’asụsụ Bekee
Now the Spirit expressly states that in later times some will abandon the faith to follow deceitful spirits and the teachings of demons,Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ma na mgbe ochie ahụ kwa, e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nʼetiti ha, dịka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nʼetiti unu. Ndị a ga-esite na nzuzo na-ewebata ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nʼiyi, ha ga-agọnarị ọ bụladị onye kachasị ihe niile, bụ Onyenwe, onye gbapụtara ha. Ha na-eweta ịla nʼiyi na mberede, na-atụkwasị onwe ha nʼisi.Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst. Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè. Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ.Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọNʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi.Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.Anyị sitere na Chineke, onye ọbụla maara Chineke na-ege anyị ntị, ma onye ọbụla na-esiteghị na Chineke anaghị ege anyị ntị. Ọ bụ otu a ka anyị si amata mmụọ eziokwu na mmụọ nke okwu ụgha.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike