Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Hibru 13:5
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Hibru 13:5
Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
N’ọnọdụ ya
2Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nʼihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị.
3Chetanụ ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nʼụlọ mkpọrọ. Chetakwanụ ndị a na-ata ahụhụ, dịka a ga-asị na unu onwe unu so ha na-ahụ ahụhụ nʼahụ unu.
4Ka ọlụlụ dị na nwunye bụrụ ihe onye ọbụla na-akwanyere ugwu, ka ihe ndina unu bụrụkwa nke a na-emerụghị emerụ. Nʼihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị ụrụ ikpe.
5Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
6Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
N’asụsụ Bekee
Keep your lives free from the love of money and be content with what you have, for God has said: “Never will I leave you, never will I forsake you.”Ihe e hotara n’Agba Ochie
Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.”Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa, mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha. Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ.Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu. Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka; aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike