Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 28:19

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Matiu 28:19

Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.

Gụọ isi ahụ dum: Matiu 28

N’ọnọdụ ya

16Ma ndị ikom iri na otu ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya gara Galili, nʼelu ugwu ebe Jisọs gwara ha gaa.

17Mgbe ha hụrụ ya, ha kpọrọ isiala nye ya. Ma ụfọdụ nʼime ha nwere obi abụọ.

18Jisọs bịara ha nso, gwa ha sị, “E werela ikike niile dị nʼeluigwe na nke dị nʼelu ụwa nye m.

19Ya mere, gaanụ mee ka mba niile bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-emenụ ha baptizim nʼaha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.

20Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.”

Matiu 28

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleMatthew 28:19Therefore go and make disciples of all nations, baptizing them in the name of the Father, and of the Son, and of the Holy Spirit,

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Mak 16:15–16Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma. Onye ọbụla kweerenụ na onye e mekwara baptizim ka a ga-azọpụta. Ma a ga-ama onye ọbụla na-ekwereghị ikpe.
Ọrụ 2:38–39Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ unu niile. Ka e mekwa unu baptizim nʼaha Jisọs Kraịst, maka mgbaghara mmehie unu. Unu ga-anatakwa onyinye nke Mmụọ Nsọ. Nkwa a dịrị unu na ụmụ ụmụ unu na mmadụ niile nọ nʼebe dị anya, dịkwara ndị niile Onyenwe anyị Chineke ga-akpọ ka ha bịakwute ya.”
Ọrụ 1:8Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.”
Luk 24:47–48Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a.
Ọrụ 19:3–5Ya mere, ọ sịrị, “Gịnị ka unu kwenyere nʼime ya mgbe e mere unu baptizim?” Ha sịrị, “Baptizim nke Jọn.” Mgbe ahụ, Pọl sịrị, “Baptizim Jọn bụ nke gbasara nchegharị site na mmehie, na-agwa ndị mmadụ ka ha kwere nʼonye ahụ na-eso ya na-abịa, nke bụ, ikwere nʼime Jisọs.” Mgbe ha nụrụ nke a, e mere ha baptizim nʼaha Onyenwe anyị Jisọs.
Aịz 49:6Ọ sịrị, “Ọ bụ ihe dị nta karịa, gị ị bụrụ m ohu, ịkpọghachita ebo niile nke Jekọb na ịkpọghachita ndị Izrel ndị m chebere. Aga m emekwa ka ị bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka nzọpụta m site nʼaka gị ruo ndị bi na nsọtụ ụwa niile.”
Gal 3:27Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime Kraịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha Kraịst.
Ọrụ 10:47–48“Ọ dị onye pụrụ igbochi anyị ime ndị a baptizim. Ndị natara Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị?” Nʼihi nke a, o nyere iwu ka e mee ha baptizim nʼaha Jisọs Kraịst. Ha rịọrọ ya ka ọ nọnyere ha ụbọchị ole na ole.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike