Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 11:28
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Matiu 11:28
“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.
N’ọnọdụ ya
25Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.
26E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.
28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.
29Nyaranụ yoku nke m nʼolu unu, mụtakwanụ ihe site nʼaka m. Nʼihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nʼobi. Unu ga-achọtakwara mkpụrụobi unu izuike.
30Nʼihi na yoku m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.”
N’asụsụ Bekee
Come to Me, all you who are weary and burdened, and I will give you rest.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri.Onye ọbụla Nna ahụ nyere m ga-abịakwute m, onye ọbụla na-abịakwute m, agaghị m achụpụ ya.Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ.Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ, bịanụ na mmiri, unu ndị na-enweghị ego bịanụ zụọ, riekwa. Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehi na-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla. Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri? Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ? Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nri mkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma! “Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m! Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ. Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi, bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla.Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, Onye mgbapụta unu, bụ Onye nsọ Izrel, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, onye na-ezi unu ihe nʼihi ọdịmma unu, na-eduzikwa unu nʼụzọ unu kwesiri iso. A sịkwarị na unu ṅara ntị nʼiwu m niile, udo unu gaara na-eru dịka osimiri, ọdịmma unu adịkwa ka mmali nke ebili oke osimiri.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike