Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jeremaya 1:5

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Jeremaya 1:5

“Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị, tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ, ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile.”

Gụọ isi ahụ dum: Jeremaya 1

N’ọnọdụ ya

2Onye okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere nʼafọ nke iri na atọ nʼoge ọchịchị Amọn, eze Juda bụ nwa Josaya.

3Ozi ndị ọzọ rukwara ya ntị nʼoge Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda, ruokwa nʼọnwa nke ise nʼafọ nke iri na otu nke Zedekaya nwa Josaya, bụ eze Juda kwụsịrị, mgbe a dọkpụụrụ ndị Jerusalem nʼagha buru ha ka ha gaa biri na mba ọzọ.

4Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị,

5“Amaara m gị tupu a tụrụ ime gị, tupu a mụọ gị, edoro m gị nsọ, ahọpụtakwara m gị dịka onye amụma nye mba niile.”

6Asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Lee, amaghị m ekwu okwu. Abụ m naanị nwantakịrị.”

7Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu.

8Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremaya 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleJeremiah 1:5“Before I formed you in the womb I knew you, and before you were born I set you apart and appointed you as a prophet to the nations.”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Abụ 139:16Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị.
Aịz 49:1Geenụ m ntị, unu niile ndị bi nʼala mmiri gbara gburugburu, nụrụkwanụ nke a, unu ndị nọ na mba dị anya. Onyenwe anyị kpọrọ m tupu amụọ m. Ọ kpọrọ m aha m mgbe m ka nọ nʼime afọ nne m.
Gal 1:15–16Ma mgbe ọ tọrọ Chineke ụtọ, bụ onye kewapụrụ m iche tupu amụọ m, kpọọ m site nʼamara ya, ikpughe Ọkpara ya nʼime m, ka m nwe ike kwusaa ihe banyere ya nʼetiti ndị mba ọzọ, e jekwurughị m anụ ahụ ọbụla ịnụta ihe ọbụla nʼaka ya.
Abụ 71:5–6Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị. Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị.
Rom 8:29Nʼihi na ndị ahụ ọ maararị ka ọ kakwara akara ka ha nwe ụdịdị nke Ọkpara ya, ka ọ bụrụ nwa e buru ụzọ mụọ nʼetiti ọtụtụ ụmụnna.
Aịz 49:5Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị, Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi; ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya, nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị, Chineke m aghọkwaarala m ike m.
Aịz 44:2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.
2Tm 2:19–21Ma ntọala Chineke hiwere na-eguzosi ike. Nʼelu ya ka eji ihe e dere kaa akara: “Onyenwe anyị maara ndị bụ ndị nke ya,” ya na, “Ka onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye nke Kraịst kwụsị ibi ndụ ajọ omume.” Nʼime ụlọ ukwuu, ọtụtụ ngwa ọrụ dị ya, ndị e ji ọlaedo maọbụ ọlaọcha, maọbụ osisi maọbụ ụrọ kpụọ. Ụfọdụ ka e ji eje ozi nʼoge nkwanye ugwu dị mkpa, ndị ọzọ ka e ji eje ozi nʼoge ọbụla. Ọ bụrụ na onye ọbụla edoo onwe ya ọcha pụọ nʼihe ọjọọ niile, ọ ga-abụ ngwa ọrụ e mere maka ọrụ ndị kwesiri nkwanye ugwu, bụrụkwa onye dị nsọ, onye na-abara Onyenwe ya uru, na onye dị njikere mgbe ọbụla ịrụ ezi ọrụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike