Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Hibru 13:17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Hibru 13:17

Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Hibru 13

N’ọnọdụ ya

14Nʼihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, ma anyị na-ele anya obodo nke gaje ịbịa.

15Site na ya, ka anyị na-achụrụ Chineke aja otuto mgbe niile, nke bụ mkpụrụ egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta aha ya.

16Unu echefula ime ihe ọma, meekwanụ ka ndị ọzọ soro unu kekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.

17Ka unu na-ekwenyere ndị ndu unu, dokwaanụ onwe unu nʼokpuru ha. Nʼihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụobi unu dịka ndị ga-aza azịza. Meenụ nke a ka ha were ọṅụ na-eje ozi ha, ma ọ bụghị site nʼobi mwute nʼihi na nke a agaghị abara unu uru.

18Na-ekperenụ anyị ekpere, nʼihi na o doro anyị anya na anyị nwere akọnuche dị ọcha na-achọkwa ibi ndụ nwere ugwu nʼụzọ niile.

19Ana m arịọsị unu ya ike, ka unu mee nke a, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ.

20Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ,

Ndị Hibru 13

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleHebrews 13:17Obey your leaders and submit to them, for they watch over your souls as those who must give an account. To this end, allow them to lead with joy and not with grief, for that would be of no advantage to you.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Te 5:12–13Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ. Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nʼịhụnanya nʼihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nʼudo.
1Tm 5:17Nye ndị okenye, ndị na-achị nke ọma nsọpụrụ kwesiri ekwesi na ụgwọ ọrụ okpukpu abụọ, ọkachasị ndị na-adọgbu onwe ha nʼọrụ izi oziọma na nʼikuzi ihe.
Hib 13:7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
1Pt 5:5Nʼotu aka ahụ, unu ụmụ okorobịa, doonụ onwe unu nʼokpuru ndị bụ okenye. Unu niile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nʼihi na, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
Ọrụ 20:28Ma ugbu a, kpacharanụ anya! Leziekwanụ onwe unu na igwe atụrụ nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị nlekọta anya ya. Ka unu bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nke chọọchị Chineke, bụ nke o ji ọbara ya zụtara onwe ya.
1Pt 5:2–3na-azụnụ igwe atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nʼaka. Ka unu na-elekọta ha, ọ bụghị nʼihi na unu agaghị ime otu a, kama ọ bụ ihe sitere nʼọchịchọ obi unu, dị ka Chineke chọrọ ka unu mee. Ọ bụkwaghị nʼihi ego unu ga-enweta, kama ọ bụ ịnụ ọkụ unu nʼije ozi. Unu abụla ọkaaka nʼebe ndị e nyefere unu nʼaka nọ. Kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye igwe atụrụ ahụ.
1Kọ 16:16Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị.
Jer 13:17Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike