Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Hibru 13:8
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Hibru 13:8
Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
N’ọnọdụ ya
5Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”
6Ya mere anyị pụrụ iji obi ike na-atụghị egwu kwuo, “Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”
7Chetanụ ndịisi unu, ndị gwara unu okwu Chineke. Tuleenụ otu ndụ siri dị, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.
8Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.
9Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu. Nʼihi na ọ bụ ihe dị mma ka e were amara mee ka obi sie ike, ọ bụghị site nʼidebe iwu banyere nri nke na-enweghị uru ọ bara ndị na-edebe ya.
10Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị niile na-eje ozi ha nʼụlọ ikwu a enweghị ike iri aja a chụrụ nʼelu ya.
11Onyeisi nchụaja na-ewebata ọbara ụmụ anụ ndị ahụ nʼEbe Kachasị Nsọ dịka aja maka mmehie, ma a na-erepịa anụ ahụ ha ọkụ na mpụga ụlọ ikwu.
N’asụsụ Bekee
Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
“Nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị adịghị agbanwe agbanwe. Ya mere, unu bụ ụmụ Jekọb ji dịgide.Onyinye ọbụla dị mma, na nke zuruoke na-esite nʼeluigwe abịa. Ọ na-esite nʼebe Nna nke ìhè niile onye na-adịghị agbanwe agbanwe, ọ naghị ezonarị ụmụ mmadụ ihu ya.Otu a ka Onyenwe anyị Chineke kwuru, “Abụ m Alfa na Omega, onye na-adị, onye ahụ dịkwaarị, na onye ahụ na-aga ịbịa, bụ onye pụrụ ime ihe niile.”Ị ga-apịakọta ha, gbanwee ha dị ka akwa. Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe. Ọnụọgụgụ afọ gị agaghị enwe ọgwụgwụ ruo mgbe ebighị ebi.”“Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile: Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ; ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe, ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ. Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide; ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”Tupu e kee ugwu niile, na tupu a kpụọ ụwa na elu ụwa, siterị na mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi, ị bụ Chineke.Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike