Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Hibru 10:25
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Hibru 10:25
Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
N’ọnọdụ ya
22ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị.
23Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.
24Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ.
25Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
26Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile.
27Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.
28Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya.
N’asụsụ Bekee
Let us not neglect meeting together, as some have made a habit, but let us encourage one another, and all the more as you see the Day approaching.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere.Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.Nʼihi na ebe ọbụla mmadụ abụọ maọbụ atọ zukọtara nʼaha m, mụ onwe m nọ nʼetiti ha.”Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.Eji m aha Onyenwe anyị ma ya ikpe. Mgbe unu zukọrọ, aga m anọnyere unu na mmụọ. Nʼoge ahụ, site nʼike Onyenwe anyị Jisọs,Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-agba onwe unu ume mgbe niile.Nʼụbọchị mbụ nʼizu ụka, mgbe anyị zukọrọ ịnyawa achịcha, Pọl gwara ha okwu, ebe ọ na-akwado ịla ma chi bọọ, o kwugidere okwu ruo nʼetiti abalị.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike