Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Hibru 9:27

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Hibru 9:27

Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie,

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Hibru 9

N’ọnọdụ ya

24Nʼihi na ọ bụghị nʼebe nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, nke yiri nke dị nʼeluigwe, ka Kraịst banyere, kama ọ banyere nʼime eluigwe nʼonwe ya, bụ ebe ọ na-anọchite anya anyị ugbu a nʼihu Chineke.

25Ọ banyeghị na ya ka o were onwe ya chụọ aja ọtụtụ ugboro, dị ka onyeisi nchụaja na-eji ọbara na-abụghị nke ya na-abanye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ kwa afọ.

26Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja.

27Dị ka ọ bụ ihe a kwadooro mmadụ ọbụla ịnwụ naanị otu ugboro, ma e mesịa ikpe esochie,

28otu a ka e si chụọ Kraịst dị ka aja naanị otu ugboro iwepụ mmehie ọtụtụ mmadụ. Ọ ga-abịaghachi nke ugboro abụọ, ma ọ bụghị nʼihi ibu mmehie, kama ọ bụ nʼihi iweta nzọpụta nye ndị ahụ niile na-eche ọbịbịa ya.

Ndị Hibru 9

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleHebrews 9:27Just as man is appointed to die once, and after that to face judgment,

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

2Kọ 5:10Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.
Ekl 12:14Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe, ya na ihe nzuzo anyị niile, ma ha dị mma ma ha dị njọ.
Ekl 12:7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta; mmụọ anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.
Ọrụ 17:31Nʼihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa niile ikpe nʼụzọ ezi omume, site nʼaka otu nwoke ọ họpụtara. O mekwara ka nke a guzosie ike, mgbe o mere ka onye ahụ sị nʼọnwụ bilie.”
2Sa 14:14Anyị niile ga-anwụ. Anyị dịkwa ka mmiri a wụsara nʼala, nke a na-apụghị ịchịkọtakwa ọzọ. Ma Chineke adịghị anapụ mmadụ ndụ ya, ma ọ na-emeghepụ ụzọ ga-eme ka onye ọ chụpụrụ achụpụ lọghachikwutekwa ya.
Jọn 5:26–29Dị ka Nna ahụ nwere ndụ nʼime onwe ya, otu a ka o nyekwara Ọkpara ahụ ike inwe ndụ nʼime onwe ya. O nyekwala ya ikike ikpe ikpe nʼihi na ọ bụ Nwa nke Mmadụ. “Ka nke a hapụ iju unu anya, nʼihi na oge na-abịa, mgbe ndị niile nọ nʼili ha ga-anụ olu ya ma pụta, ndị mere ihe dị mma ga-ebili dịrị ndụ. Ma ndị mere ihe ọjọọ ga-ebili bụrụ ndị a ga-ama ikpe.
Ekl 9:5Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ, ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla; ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ, nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu.
Jud 1:15Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike