Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Hibru 4:12

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Hibru 4:12

Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Hibru 4

N’ọnọdụ ya

9Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke.

10Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya.

11Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha.

12Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.

13Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.

14Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike.

15Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya.

Ndị Hibru 4

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleHebrews 4:12For the word of God is living and active. Sharper than any double-edged sword, it pierces even to dividing soul and spirit, joints and marrow. It judges the thoughts and intentions of the heart.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Jer 23:29“Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe nke na-etiwasị nkume?”
Aịz 55:11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị. Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu. Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee, baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.
Efe 6:17Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.
Abụ 119:130Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe.
1Pt 1:23Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa.
Aịz 49:2O mere ka okwu sị m nʼọnụ dịrị nkọ dịka mma agha. O zobere m nʼaka ya kpuchie m. O mere m ka m dịrị ka àkụ dị nkọ nke o zoro nʼime akpa àkụ ya.
Mkp 1:16O jidere kpakpando asaa nʼaka nri ya, mma agha dị nkọ nwere ihu abụọ sikwa nʼọnụ ya na-apụta. Ihu ya na-egbu maramara dịka anyanwụ na-acha nʼike ya niile.
1Te 2:13Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike