Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Timoti 1:7

Amaokwu Baịbụl · IGCB

2 Timoti 1:7

Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.

Gụọ isi ahụ dum: 2 Timoti 1

N’ọnọdụ ya

4Ka m na-echeta anya mmiri gị, ọ na-agụsị m agụụ ike ehihie na abalị ịhụ gị, ka ọṅụ m zuo oke.

5Emere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ nʼadịghị nke i nwere, bụ okwukwe nke burii ụzọ dịrị nʼime nne nne gị Lọịsi, bịa dịkwa nʼime nne gị Yunaịsi. Emere ka m kwenye na otu okwukwe ahụ dịkwa nʼime gị.

6Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi.

7Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.

8Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ.

9Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a.

10Ugbu a, o meela ka ihe niile o zubere pụta ìhè site nʼọbịbịa Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike ọnwụ nʼiyi, zi anyị ụzọ anyị ga-esi nwee ndụ ebighị ebi site nʼoziọma ahụ.

2 Timoti 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible2 Timothy 1:7For God has not given us a spirit of fear, but of power, love, and self-control.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Rom 8:15Nʼihi na unu anataghị mmụọ nke na-eme unu ndị ohu ọzọ nye ịtụ ụjọ, kama unu natara Mmụọ nke mere unu ụmụ Chineke. Ọ bụ site na Mmụọ ahụ ka anyị ji na-akpọ “Abba, Nna.”
1Jọn 4:18Ịtụ egwu adịghị nʼebe ịhụnanya dị, kama ịhụnanya zuruoke na-achụpụ egwu nʼihi na egwu na ntaramahụhụ na-arụkọ ọrụ, onye ọbụla nke na-atụ egwu bụ onye na-ezubeghị oke nʼịhụnanya.
Jọn 14:27Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo m ka m na-enyekwa unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye ka m na-enye unu. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri, ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.
Gal 5:22Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,
Luk 10:19Lee! Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, na imegide ike niile nke onye iro; ọ dịghị ihe ọbụla ga-emerụ unu ahụ.
Ọrụ 1:8Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ, unu ga-agbara m ama na Jerusalem, na Judịa niile ya na Sameria ruokwa ebe niile ụwa sọtụrụ.”
Zek 4:6Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
Ilu 2:7Ọ na-edebere ndị ụzọ ha ziri ezi nzube ọganihu, ọ bụ ọta nye ndị na-eje ije nʼizuoke.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike