Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Hibru 11:6

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Hibru 11:6

Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Hibru 11

N’ọnọdụ ya

3Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya.

4Ebel sitere nʼokwukwe chụọ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke Ken chụrụ; nke e si na ya gụnye ya nʼonye ezi omume. Chineke kwuru okwu banyere onyinye ya. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na ọ nwụọlarị ma ọ ka na-ekwu okwu site nʼokwukwe.

5E sitere nʼokwukwe kupu Enọk nke pụtara na ọ nwụghị anwụ, a hụkwaghị ya ọzọ nʼihi na Chineke akpọrọla ya. Ma tupu e kuru ya, e mere ka anyị mara na ọ mere ihe masịrị Chineke.

6Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nʼihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị ikwe na ọ dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọbụla na-achọsi ya ike ụgwọ.

7Site nʼokwukwe, Noa, onye nke a dọrọ aka na ntị gbasara ihe ndị a na-ahụbeghị anya, gere ntị ma ruo ụgbọ mmiri maka nzọpụta nke ezinaụlọ ya. Site na nke a, ọ mara ụwa ikpe, ma bụrụ onye nketa nke ezi omume sitere nʼokwukwe.

8Site nʼokwukwe, Ebraham rubere isi mgbe a kpọrọ ya ka ọ hapụ, gaa nʼala ahụ nke ọ ga-enweta dịka ihe nketa. Ọ gawara nʼamaghị ebe ọ na-aga.

9Okwukwe ka o jiri biri dịka ọbịa nʼala ahụ e kwere ya na nkwa, na-ebi nʼụlọ ikwu, ya na Aịzik na Jekọb, bụ ndị e kwere ya na ha otu nkwa ahụ.

Ndị Hibru 11

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleHebrews 11:6And without faith it is impossible to please God, because anyone who approaches Him must believe that He exists and that He rewards those who earnestly seek Him.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 8:17Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.
Jer 29:13–14Unu ga-achọsikwa m ike, chọta m ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile chọọ m. Aga m emekwa ka unu chọta m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “meekwa ka unu bụ ndị a dọtara nʼagha lọta. Aga m esitekwa na mba ahụ niile m chụgara unu chịkọtaa unu, kpọghachitekwa unu nʼebe ahụ m si chụpụ unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Mat 6:33Ma burunu ụzọ chọọ alaeze ya na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
Abụ 105:3–4Ṅụrianụ nʼime aha nsọ ya; ka obi ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ṅụrịa. Na-achọnụ Onyenwe anyị na ike ya, chọọnụ ihu ya mgbe niile.
1Ih 28:9“Ma gị, Solomọn nwa m, mara Chineke nke nna gị, jiri obi zuruoke, na mmụọ nwere njikere mgbe niile fee Onyenwe anyị ofufe, nʼihi na Onyenwe anyị na-enyocha obi mmadụ niile. Ọ na-aghọtakwa ihe niile anyị bu nʼobi na echiche niile. Ọ bụrụ na ị chọsie ụzọ ya ike, ị ga-achọta ya, ma ọ bụrụ na ị jụ ya, ọ ga-ajụ gị ruo ebighị ebi.
Luk 12:31Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile.
Abụ 119:10Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.
Hib 7:25Ya mere o nwere ike ịzọpụta ruo mgbe niile ndị ahụ na-abịakwute Chineke site na ya, nʼihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe niile ịrịọ arịrịọ nʼihi ha.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike