Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Ndị Kọrint 5:17

Amaokwu Baịbụl · IGCB

2 Ndị Kọrint 5:17

Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.

Gụọ isi ahụ dum: 2 Ndị Kọrint 5

N’ọnọdụ ya

14Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla.

15Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie.

16Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a.

17Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.

18Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo.

19Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.

20Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo.

2 Ndị Kọrint 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible2 Corinthians 5:17Therefore if anyone is in Christ, he is a new creation. The old has passed away. Behold, the new has come!

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Izk 36:26Aga m enye unu obi ọhụrụ, kenyekwa unu mmụọ ọhụrụ. Aga m ewepụ obi nkume nke mmehie dị nʼime unu, nye unu mkpụrụobi nke anụ ahụ.
Efe 4:22–24Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile, ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ. Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.
Aịz 43:18–19“Chefuonu ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga; unu atụgharịkwala uche unu na ha. Kama leenụ anya ihe ọhụrụ nke m na-aga ime. Leenụ ya nʼihi na o bidolarị ịpụta ihe. Ọ ga-abụ na unu adịghị ahụ ya? Nʼihi na ana m akwa okporoụzọ nʼọzara, na-emekwa ka mmiri jupụta nʼala tọgbọrọ nʼefu.
Jọn 3:3Jisọs zara sị ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, ọ bụrụ na amụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.”
Abụ 51:10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
Izk 11:19Aga m enyekwa ha otu obi, tinyekwa mmụọ ọhụrụ nʼime ha. Aga m ewepụ site nʼime ha obi kpọrọ nkụ ma nye ha obi nke anụ ahụ.
Rom 8:1Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst.
Gal 6:15Obibi ugwu abụghị ihe, ebighị ugwu abụghịkwa ihe, kama ị bụ onye e kere ọhụrụ bụ ihe dị mkpa.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike