Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Efesọs 5:25

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ndị Efesọs 5:25

Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.

Gụọ isi ahụ dum: Ndị Efesọs 5

N’ọnọdụ ya

22Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị.

23Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya.

24Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile.

25Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya.

26O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha.

27Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta.

28Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya.

Ndị Efesọs 5

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEphesians 5:25Husbands, love your wives, just as Christ loved the church and gave Himself up for her

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

1Pt 3:7Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.
Kọl 3:19Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.
Jen 2:24Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.
Efe 5:33Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
Efe 5:2Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike