Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Jọn 2:15–17
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Jọn 2:15–17
15Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya.
16Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
17Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
N’ọnọdụ ya
12Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya.
13Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.
14Ana m edere unu ụmụntakịrị, nʼihi na unu maara nna ahụ. Ana m edere unu ndị nna, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu siri ike, okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu, unu emeriekwala ajọ onye ahụ.
15Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya.
16Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
17Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
18Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ.
19Ha si nʼetiti anyị pụọ, ma ha abụghị ndị nke anyị nʼezie. Nʼihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara aga nʼihu soro anyị nọdụ. Ma ọpụpụ ha pụrụ na-egosi na ọ dịghị onye nʼime ha sonyere anyị.
20Ma unu nwere otite mmanụ sitere nʼOnye Nsọ ahụ, unu niile matakwara ihe niile.
N’asụsụ Bekee
Do not love the world or anything in the world. If anyone loves the world, the love of the Father is not in him. For all that is in the world—the desires of the flesh, the desires of the eyes, and the pride of life—is not from the Father but from the world. The world is passing away, along with its desires; but whoever does the will of God remains forever.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke.“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.Ya mere, ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nʼọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nʼihe dị nʼeluigwe ebe Kraịst nọ nʼakụkụ aka nri Chineke. Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nʼụwa.“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.”Nʼihi na onye ọbụla amụrụ site na Chineke na-emeri ụwa. Nke a bụkwa mmeri ahụ na-emeri ụwa, ọ bụladị okwukwe anyị. Onye pụrụ imeri ụwa, ma ọ bụghị naanị onye ahụ kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa ga-ahụ unu nʼanya dịka ndị nke ya. Ma otu ọ dị unu abụghị nke ụwa. Kama, esi m nʼime ụwa họrọ unu. Ọ bụkwa nʼihi ya ka ụwa ji akpọ unu asị.Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike