Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ememe nke afọ chọọchị › Krismas

Ememe nke afọ chọọchị

Krismas

Ọmụmụ Jizọs dị ka Matiu na Luk si kọọ ya, ya na amụma Aịzaya na mmalite Oziọma Jọn, zuru oke. Chọọchị ndị Ọdịda Anyanwụ na-eme Krismas na 25 Disemba; Chọọchị Ọtọdọks nke kalenda Julian na 7 Jenụwarị.

Ụbọchị

AfọChọọchị ndị Ọdịda AnyanwụKrismasChọọchị ỌtọdọksỌmụmụ Kraịst
202625 Disemba 2026Fraịdee7 Jenụwarị 2027Tọọzdee
202725 Disemba 2027Satọdee7 Jenụwarị 2028Fraịdee
202825 Disemba 2028Mọnde7 Jenụwarị 2029Sọnde
202925 Disemba 2029Tiuzdee7 Jenụwarị 2030Mọnde
203025 Disemba 2030Wenezdee7 Jenụwarị 2031Tiuzdee

Ụbọchị na-emeghe ihe ọgụgụ nke ụbọchị ahụ na kalenda Ọtọdọks ma ọ bụ Katọlik.

Ụbọchị Ọtọdọks dị ka kalenda Julian, nke Chọọchị Rọshịa, Sebia na Jọjịa na Ugwu Athos na-agbaso: ememe ha na-adịghị agbanwe na-adaba ụbọchị 13 ka e mesịrị na kalenda obodo. Chọọchị ndị kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria na ndị ọzọ) na-eme Krismas na 25 Disemba; a na-agụ Ista na ụbọchị ndị dabere na ya otu ụzọ ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Chọọchị Ọtọdọks niile.

Akụkụ Baịbụl

Aịzaya

Aịz 9:2–7

2Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị. 3I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha. 4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia, i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha. 5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma. 6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo. 7Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a.

Matiu

Mat 1:18–25

18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”). 24Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya. 25Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.

Luk

Luk 2:1–20

1Nʼoge ahụ, Siza Ọgọstọs nyere iwu ka a gụọ ọnụ, detuo aha mmadụ niile bi nʼụwa dum. 2(Nke a bụ ịgụ ọnụ na ide aha nke mbụ e mere mgbe Kwirinus bụ onye na-achị Siria.) 3Onye ọbụla gara nʼobodo ya, ka e denye aha ya nʼakwụkwọ. 4Ya mere Josef hapụrụ Nazaret nke dị na Galili, gaa Betlehem nke dị na Judịa, nke bụkwa obodo Devid, nʼihi na o si nʼụlọ na agbụrụ Devid pụta. 5Ya na Meri, nwaagbọghọ o kwere nkwa ịlụ, nke dịkwa ime, soro gaa ka o denye aha ha. 6Mgbe ha nọ ebe ahụ, oge ọ ga-eji mụọ nwa ya zuru. 7Ọ mụrụ nwa nwoke mbụ ya. O ji akwa kee ya, nibe ya nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri, nʼihi na ha enwetaghị ebe ndina nʼụlọ ndị ije. 8Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị. 9Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha. 10Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile. 11Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị. 12Nke a ga-abụrụ unu ihe ịrịbama, unu ga-ahụ nwata ọhụrụ e kechiri nʼakwa, dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri.” 13Na mberede, igwe ndị mmụọ ozi nke eluigwe pụtara soro mmụọ ozi a, bido na-eto Chineke na-asị, 14“Otuto dịrị Chineke nʼebe kachasị elu nke eluigwe. Udo nʼelu ụwa nye ndị niile ihe ha dị Chineke ezi mma.” 15Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ hapụrụ ha, laghachi nʼeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betlehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a merenụ, nke Onyenwe anyị mere ka anyị mara.” 16Ha gara ọsịịsọ hụ Meri na Josef, na nwata ahụ ka o dina nʼime ebe a na-enye anụ ụlọ nri. 17Mgbe ha hụrụ nke a, ha mere ka a mata ihe niile a gwara ha banyere nwantakịrị a. 18Ihe ndị ọzụzụ atụrụ a kwuru juru ndị niile nụrụ ya anya. 19Ma Meri debere ihe ndị a niile nʼobi ya, na-atụgharị ihe banyere ha nʼobi ya. 20Ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri, na-eto Chineke na-ebulikwa aha ya elu nʼihi ihe niile ha nụrụ ma hụkwa, nke dịkwa ka a gwara ha.

Matiu

Mat 2:1–12

1Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem, 2na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.” 3Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ. 5Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, 6“ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’” 7Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. 8O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.” 9Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ. 10Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. 11Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá. 12Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.

Jọn

Jọn 1:1–14

1Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke. 2Ya na Chineke nọ site na mbụ. 3E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya. 4Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile, 5ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya. 6Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. 7Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere. 8Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ. 9Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa. 10Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ. 11Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya. 12Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. 13Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke. 14Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.

N’ihe nkà

Ọrụ niile

Ememe ndị ọzọ

Ememe nke afọ chọọchị

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike