Ụlọ › Ememe nke afọ chọọchị › Epifanị na Teofanị
Ememe nke afọ chọọchị
Epifanị na Teofanị
Na 6 Jenụwarị, chọọchị ndị Ọdịda Anyanwụ na-echeta nleta ndị amamihe; Chọọchị Ọtọdọks na-eme Teofanị, baptizim Jizọs n’Osimiri Jọdan — na 19 Jenụwarị na Chọọchị ndị kalenda Julian. Akụkụ Oziọma nke ha abụọ, zuru oke.
Ụbọchị
| Afọ | Chọọchị ndị Ọdịda AnyanwụEpifanị | Chọọchị ỌtọdọksTeofanị |
|---|---|---|
| 2027 | 6 Jenụwarị 2027Wenezdee | 19 Jenụwarị 2027Tiuzdee |
| 2028 | 6 Jenụwarị 2028Tọọzdee | 19 Jenụwarị 2028Wenezdee |
| 2029 | 6 Jenụwarị 2029Satọdee | 19 Jenụwarị 2029Fraịdee |
| 2030 | 6 Jenụwarị 2030Sọnde | 19 Jenụwarị 2030Satọdee |
| 2031 | 6 Jenụwarị 2031Mọnde | 19 Jenụwarị 2031Sọnde |
Ụbọchị na-emeghe ihe ọgụgụ nke ụbọchị ahụ na kalenda Ọtọdọks ma ọ bụ Katọlik.
Ụbọchị Ọtọdọks dị ka kalenda Julian, nke Chọọchị Rọshịa, Sebia na Jọjịa na Ugwu Athos na-agbaso: ememe ha na-adịghị agbanwe na-adaba ụbọchị 13 ka e mesịrị na kalenda obodo. Chọọchị ndị kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria na ndị ọzọ) na-eme Krismas na 25 Disemba; a na-agụ Ista na ụbọchị ndị dabere na ya otu ụzọ ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Chọọchị Ọtọdọks niile.
Akụkụ Baịbụl
Matiu
1Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem, 2na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.” 3Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ. 5Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, 6“ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’” 7Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. 8O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.” 9Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ. 10Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. 11Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá. 12Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.
Matiu
13Mgbe ahụ, Jisọs sitere na Galili bịa nʼosimiri Jọdan ka Jọn mee ya baptizim. 14Ma Jọn chọrọ igbochi ya, sị, “Ọ bụ m kwesiri ịbịakwute gị ka ị mee m baptizim. Gịnị mere i ji abịakwute m?” 15Ma Jisọs zara ya sị, “Kwere ka ọ dịrị otu a ugbu a, o kwesiri ka anyị mezuo ezi omume niile.” Mgbe ahụ Jọn kwenyere. 16Ngwangwa e mechara Jisọs baptizim, o sitere na mmiri ahụ rịpụta. Nʼotu oge ahụ, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ nke Chineke ka o si nʼelu fedata dị ka nduru na-ebekwasị Jisọs nʼisi. 17Otu olu sitere nʼeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Ihe ya dị m ezi mma.”
Mak
9Nʼoge ahụ, Jisọs sitere na Nazaret nke Galili bịa nʼosimiri Jọdan, ebe Jọn mere ya baptizim. 10Ma mgbe o si nʼime mmiri ahụ na-apụta, ọ hụrụ ka eluigwe meghere. Hụkwa Mmụọ Nsọ dị ka nduru ka ọ rịdatara bekwasị ya nʼisi ya. 11Otu olu si nʼeluigwe daa, “Ị bụ Ọkpara m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”
Jọn
29Nʼechi ya, ọ hụrụ ka Jisọs na-abịakwute ya sị, “Leekwa, Nwa Atụrụ Chineke, onye na-ebupụ mmehie ụwa. 30Ọ bụ onye a ka m kwuru okwu ya mgbe ahụ m sịrị, ‘otu nwoke na-abịa nʼazụ m, onye dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ 31Mụ onwe m amataghị ya, ma a bịara m were mmiri na-eme baptizim nʼihi nke a, ka e kpughee ya nye ndị Izrel.” 32Mgbe ahụ Jọn gbara ama a sị, “Ahụrụ m ka Mmụọ Nsọ sitere nʼeluigwe rịdata dị ka nduru, nọkwasị ya. 33Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’ 34Mụ onwe m ahụla ya, na-agbakwa ama na onye a bụ Ọkpara Chineke.”
N’ihe nkà
Ndị Amamihe Na-akpọ IsialaFra Angelico na Fra Filippo Lippi · ihe dị ka 1440/1460
Baptizim nke KraịstJuan de Flandes · ihe dị ka 1508/1519
Kpakpando Duru Ndị AmamiheGustave Doré · 1866
Ndị Amamihe Na-akpọ IsialaDürer · ihe dị ka 1501–1503
Ndị Amamihe Na-akpọ IsialaLucas van Leyden · 1513
Baptizim nke Kraịst nʼOsimiri JọdanLucas van Leyden · ihe dị ka 1510
Ndị Amamihe Na-efe Nwa Ahụ (Ms. Ludwig VII 1, fol. 25v, site nʼAkwụkwọ Ngọzi)Onye osise a na-amaghị aha, Regensburg · ihe dị ka 1030–1040
Ndị Amamihe nʼỤlọ Herọd (Les rois mages chez Hérode)James Tissot · 1886–1894
Ndị Amamihe Na-eme Njem (Les rois mages en voyage)James Tissot · 1886–1894
Ememe ndị ọzọ
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike