Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ememe nke afọ chọọchị › Izu Nsọ na Ista

Ememe nke afọ chọọchị

Izu Nsọ na Ista

Izu Nsọ site na Sọnde Nkwụ ruo Ista: ịbanye Jerusalem, Nri Anyasị Ikpeazụ, Ahụhụ na Mbilite n’Ọnwụ n’okwu Oziọma n’onwe ha, ihe mere n’izu ahụ awa na awa, na ụbọchị Ista nke Ọdịda Anyanwụ na nke Ọtọdọks maka afọ ndị na-abịa.

Ụbọchị

AfọChọọchị ndị Ọdịda AnyanwụSọnde IstaChọọchị ỌtọdọksIsta
202728 Maachị 2027SọndeSọnde Nkwụ: 21 Maachị 2027Fraịdee Ọma: 26 Maachị 20272 Mee 2027SọndeSọnde Nkwụ: 25 Epreel 2027Fraịdee Nsọ: 30 Epreel 2027
202816 Epreel 2028SọndeSọnde Nkwụ: 9 Epreel 2028Fraịdee Ọma: 14 Epreel 202816 Epreel 2028SọndeSọnde Nkwụ: 9 Epreel 2028Fraịdee Nsọ: 14 Epreel 2028
20291 Epreel 2029SọndeSọnde Nkwụ: 25 Maachị 2029Fraịdee Ọma: 30 Maachị 20298 Epreel 2029SọndeSọnde Nkwụ: 1 Epreel 2029Fraịdee Nsọ: 6 Epreel 2029
203021 Epreel 2030SọndeSọnde Nkwụ: 14 Epreel 2030Fraịdee Ọma: 19 Epreel 203028 Epreel 2030SọndeSọnde Nkwụ: 21 Epreel 2030Fraịdee Nsọ: 26 Epreel 2030
203113 Epreel 2031SọndeSọnde Nkwụ: 6 Epreel 2031Fraịdee Ọma: 11 Epreel 203113 Epreel 2031SọndeSọnde Nkwụ: 6 Epreel 2031Fraịdee Nsọ: 11 Epreel 2031

Ụbọchị na-emeghe ihe ọgụgụ nke ụbọchị ahụ na kalenda Ọtọdọks ma ọ bụ Katọlik.

Ụbọchị Ọtọdọks dị ka kalenda Julian, nke Chọọchị Rọshịa, Sebia na Jọjịa na Ugwu Athos na-agbaso: ememe ha na-adịghị agbanwe na-adaba ụbọchị 13 ka e mesịrị na kalenda obodo. Chọọchị ndị kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria na ndị ọzọ) na-eme Krismas na 25 Disemba; a na-agụ Ista na ụbọchị ndị dabere na ya otu ụzọ ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Chọọchị Ọtọdọks niile.

Akụkụ Baịbụl

Matiu

Mat 21:1–11

1Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya. 2Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha. 3Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.” 4E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo. 5“Gwanụ ada Zayọn sị, ‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu, ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ” 6Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee. 7Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha. 8Ọtụtụ nʼime igwe mmadụ ahụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Ndị ọzọ gbuturu alaka osisi, tụsaa ha nʼụzọ nʼihu ya. 9Ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ nọ nʼihu, na ndị na-esokwa nʼazụ, nọ na-eti mkpu nʼoke olu na-asị: “Hozanna dịrị Nwa Devid!” “Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị!” “Hozanna nʼebe kachasị ihe niile elu!” 10Mgbe ọ batara nʼime Jerusalem, ụzụ tụrụ, obodo ahụ niile mere mkpọtụ. Ndị mmadụ bidoro na-ajụ ajụjụ na-asị, “Onye kwa bụ onye a?” 11Igwe mmadụ ahụ nọ na-asị, “Nwoke a bụ Jisọs, onye amụma ahụ sị Nazaret, obodo dị nʼime Galili.”

Jọn

Jọn 13:1–15

1Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. Ọ hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ. 2Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka ọ rara ya nye. 3Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke. 4Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. 5Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha. 6Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, “Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?” 7Ma Jisọs zara sị ya, “Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya.” 8Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.” 9Saimọn Pita sịrị ya, “Onyenwe m, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama saakwa aka m na isi m.” 10Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile.” 11Nʼihi na ọ maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, “Ọ bụghị unu niile dị ọcha.” 12Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, “Unu ghọtara ihe m meere unu? 13Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. 14Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. 15Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu.

Matiu

Mat 26:17–30

17Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?” 18Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri Ngabiga nʼụlọ gị.’ ” 19Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka Jisọs gwara ha, doziekwa oriri Ngabiga ahụ nʼebe ahụ. 20Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ. 21Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.” 22Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?” 23Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye. 24Lee Nwa nke Mmadụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara Nwa nke Mmadụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” 25Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.” 26Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.” 27Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a. 28Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie. 29Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze Nna m.” 30Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.

Jọn

Jọn 18:1–19:42

1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ya na ndị na-eso ụzọ ya rịdara ndagwurugwu iyi Kidrọn rigorokwa nʼofe nke ọzọ, ebe e nwere otu ogige, ya na ndị na-eso ụzọ ya banyere nʼime ya. 2Judas, onye rara ya nye matakwara ebe ahụ. Nʼihi na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-anọ nʼebe ahụ ọtụtụ oge. 3Ya mere, Judas duuru otu ndị agha, na ụfọdụ ndị ozi sitere nʼetiti ndịisi nchụaja na ndị Farisii bịa nʼebe ahụ. Ha chịkwa ọwaọkụ, oriọna na ngwa agha. 4Ebe Jisọs maara ihe niile na-akwado ịbịakwasị ya, ọ pụtara sị ha, “Onye ka unu na-achọ?” 5Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụ m” (Judas onye ahụ rara ya nye so ha guzo nʼebe ahụ.) 6Mgbe Jisọs gwara ha, “Ọ bụ m,” ha laghachiri azụ, daa nʼala. 7Ọzọ ọ jụkwara ha, “Onye ka unu na-achọ?” Ha sịrị, “Ọ bụ Jisọs onye Nazaret.” 8Jisọs zara, “Agwara m unu na Ọ bụ m. Ọ bụrụ na unu na-achọ m, hapụnụ ndị a ka ha laa.” 9Nke a bụ iji mezuo okwu ahụ o kwuru na mbụ, “Etufughị m onye ọbụla nʼime ndị ahụ i nyere m.” 10Ya mere Saimọn Pita, onye ji mma agha, mịpụtara ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Aha ohu ahụ bụ Malkus. 11Ma Jisọs gwara Pita, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya! Ọ bụ na mụ agaghị aṅụ site nʼiko ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?” 12Ya mere ndị agha ahụ na ọchịagha ha, na ndị na-ejere ndị Juu ozi, jidere Jisọs kee ya agbụ. 13Ha buru ụzọ duru ya jekwuru Anas, onye bụ nna nwunye Kaịfas. Onye bụ onyeisi nchụaja nʼafọ ahụ. 14Kaịfas bụkwa onye ahụ dụrụ ndị ndu ndị Juu ọdụ, sị na ọ ka mma ka otu onye nwụọ nʼihi mmadụ niile. 15Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ ya sooro Jisọs. Nʼihi na onye nke ahụ na-eso ụzọ ya bụ onye onyeisi nchụaja maara nke ọma, o sooro Jisọs banye nʼobi onyeisi nchụaja. 16Ma Pita na-eguzo nʼezi nʼọnụ ụzọ. Onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya, nke onyeisi nchụaja maara nke ọma, pụrụ nʼezi gwa nwaagbọghọ ahụ na-eche ọnụ ụzọ okwu, ma kpọbata Pita. 17Nwaagbọghọ ahụ sịrị Pita, “Ọ bụ na ị bụghị otu nʼime ndị na-eso ụzọ nwoke a?” Pita sịrị, “Mba! Abụghị m.” 18Ndị ohu na ndị nche kwanyere ọkụ nʼihi na oyi na-atụ. Ha guzoro nʼebe ahụ na-anya ọkụ. Pita soro ha guzo na-anyakwa ọkụ. 19Nʼoge ahụ onyeisi nchụaja ahụ jụrụ Jisọs banyere ndị na-eso ụzọ ya, na ozizi ya. 20Jisọs zara ya, “Nʼihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu niile m kwuru. A kuziri m ihe nʼime ụlọ ekpere na nʼime ụlọnsọ ukwu ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọbụla na nzuzo. 21Gịnị mere i ji ajụ m? Jụọ ndị niile gere m ntị! Ha makwaara ihe niile m kwuru.” 22Mgbe o kwuru nke a, otu onye nʼime ndị na-eje ozi guzo nʼakụkụ ya, mara Jisọs ụra nʼihu, sị, “Ọ bụ otu a ka ị si aza onyeisi nchụaja ajụjụ?” 23Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na ọ dị ihe ọjọọ m kwuru, gbaa ama megide okwu ọjọọ dị otu a, ma ọ bụrụ na m kwuru eziokwu, gịnị mere i ji ama m ụra.” 24Ya mere, Anas kere ya agbụ zigara ya Kaịfas onyeisi nchụaja. 25Ma dịka Saimọn Pita ka guzo nʼebe ahụ na-anya ọkụ, ha sịrị ya, “Ọ bụ na ị bụghị otu onye nʼime ndị na-eso ụzọ ya?” Ma ọ gọrọ agọ sị, “Abụghị m ya.” 26Otu nʼime ndị ohu onyeisi nchụaja, bụ onye ikwu nwoke ahụ Pita bipụrụ ntị, sịrị, “Ọ bụ na m ahụghị gị na ya nʼime ogige ahụ?” 27Ma Pita gọkwara agọ ọzọ. Nʼotu mgbe ahụ oke ọkụkụ kwara akwa. 28Mgbe ahụ, ha sitere nʼụlọ Kaịfas duru Jisọs gaa nʼụlọeze Pailet. Ọ bụkwa nʼisi ụtụtụ, ma ha onwe ha abanyeghị nʼime ụlọeze ahụ nʼihi na ha achọghị imerụ onwe ha, ka ha nwee ike isoro rie nri na Mmemme Ngabiga. 29Pailet gakwuru ha nʼezi sị, “Gịnị bụ ebubo unu na-ebo nwoke a?” 30Ha zara ma sị ya, “Ọ bụrụ na onye a abụghị onye arụrụala, anyị agaraghị akpọtara gị ya.” 31Pailet sịrị, “Durunụ ya pụọ kpee ya ikpe nʼonwe unu dị ka iwu unu si dị.” Ndị Juu sịrị ya, “Ma anyị enweghị ikike igbu onye o bụla.” 32Nke a mere iji mezuo okwu ahụ Jisọs kwuru banyere ụdị ọnwụ ọ gaje ịnwụ. 33Mgbe ahụ Pailet baghachiri nʼime ụlọeze ahụ, zie ozi ka a kpọọrọ ya Jisọs. Ọ jụrụ ya, “Ị bụ eze ndị Juu?” 34Jisọs zara, “Ị na-ajụ nke a nʼonwe gị ka ọ bụ ihe ndị ọzọ gwara gị banyere m?” 35Pailet zara, “Abụ m onye Juu? Ọ bụ ndị ala gị na ndịisi nchụaja unu kpọtaara m gị. Gịnị ka i mere?” 36Jisọs zara, “Alaeze m abụghị nke ụwa a. A sị na alaeze m bụ nke ụwa a, ndị na-ejere m ozi gaara ịlụrụ m ọgụ iji gbochie m ịdaba nʼaka ndị Juu. Ma ugbu a, alaeze m abụghị nke ụwa a.” 37Pailet sịrị ya, “Ya bụ na ị bụ eze?” Jisọs zara, “Gị onwe gị kwuru na m bụ eze. Amụrụ m nʼihi nke a, ọ bụkwa nʼihi nke a ka m ji bi a nʼụwa ịgba ama banyere eziokwu. Onye ọbụla hụrụ eziokwu nʼanya na-ege m ntị.” 38Pailet sịrị ya, “Gịnị bụ eziokwu?” Mgbe o kwuchara nke a, ọ pụrụ jekwuuru ndị Juu ọzọ sị ha, “Ọ dịghị ihe ọbụla m chọpụtara megidere ya. 39Ma ọ bụ omenaala unu, na m ga-ahapụrụ unu otu onye mkpọrọ nʼoge Mmemme Ngabiga. Unu chọrọ ka m hapụrụ unu ‘eze ndị Juu’?” 40Ha tiri mkpu ọzọ sị, “Ọ bụghị nwoke a, ma hapụrụ anyị Barabas.” Barabas bụ onye abalị dị egwu. 19:1Mgbe ahụ, Pailet kpụụrụ Jisọs, a pịa ya ihe. 2Ndị agha kpara okpueze nke e ji ogwu mee, kpukwasị ya nʼisi, yinyekwa ya uwe mwụda na-acha odo odo. 3Ha bịakwutere ya ọtụtụ mgbe na-asị, “Ekele, gị Eze ndị Juu!” Ha na-amakwa ya ụra nʼihu. 4Pailet pụkwara nʼezi ọzọ sị ha, “Lee, ana m akpọpụtara unu ya, ka unu mara na achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 5Mgbe Jisọs yi okpu ogwu na uwe odo odo pụta, Pailet sịrị ha, “Lekwanụ nwoke ahụ!” 6Ngwangwa, ndịisi nchụaja na ndị nche hụrụ ya, ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nʼobe! Kpọgide ya nʼobe!” Pailet sịrị ha, “Kpọrọnụ ya kpọgbuo ya nʼonwe unu. Achọpụtaghị m ihe ọjọọ ọbụla o mere.” 7Ndị Juu zara ya, “Anyị nwere iwu, dị ka iwu ahụ siri dị, ihe kwesiri ya bụ ọnwụ, nʼihi na ọ kpọrọ onwe ya Ọkpara Chineke.” 8Mgbe Pailet nụrụ nke a, oke egwu tụrụ ya karịa. 9Ọ laghachiri azụ nʼime ụlọeze ahụ, jụọ Jisọs, “Olee ebe i siri bịa?” Ma Jisọs azaghị ya ihe ọbụla. 10Pailet sịrị ya, “Ị na-agba m nkịtị? Ọ bụ na ị maghị na m nwere ike ịkpọgide gị nʼobe, nweekwa ike ịhapụ gị ka ị laa?” 11Jisọs zara ya, “Ị garaghị enwe ike ọbụla nʼebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nʼelu rute gị aka. Nke a mere mmehie onye duru m nye nʼaka gị ji karịa.” 12Site na mgbe ahụ Pailet chọsịrị ike ịhapụ ya. Ma ndị Juu tisiri mkpu ike sị, “Ị hapụ nwoke a ka ọ laa, ị bụkwaghị enyi Siza. Nʼihi na onye ọbụla na-eme onwe ya eze na-elelị Siza.” 13Mgbe Pailet nụrụ okwu ndị a, ọ kpọpụtara Jisọs nʼezi, nọdụkwa ala nʼoche ikpe ya dị nʼebe a na-akpọ Pevumentị (maọbụ Gabata nʼasụsụ Hibru). 14Ọ bụ nʼihe dịka nʼoge ehihie nke ụbọchị nkwadebe maka oriri Ngabiga. Ọ sịrị ndị Juu, “Leenụ eze unu!” 15Ma ha tiri mkpu, “Kpọpụ ya, Kpọpụ ya! Kpọgide ya nʼobe.” Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m kpọgide eze unu nʼobe?” Ma ndịisi nchụaja zara, “Anyị enweghị eze ọzọ karịa Siza.” 16Mgbe ahụ, o nyefere ya nʼaka ha, ka ha kpọgide ya nʼobe. Ha kpọọrọ Jisọs pụọ. 17O buuru obe ya gaa nʼebe a na-akpọ Okpokoro Isi (nke pụtara Gọlgọta nʼasụsụ Hibru). 18Nʼebe ahụ ka ha kpọgidere ya nʼobe, ya na mmadụ abụọ ndị ọzọ. Otu onye nʼaka nri ya, onye nke ọzọ nʼaka ekpe ya. 19O nwere ihe Pailet dere kụpanye nʼelu obe ahụ. Ihe o dere bụ nke a: Jisọs onye Nazaret, Eze ndị Juu. 20Ọtụtụ ndị Juu gụrụ ihe a o dere, nʼihi na ebe a kpọgburu Jisọs dị nso nʼobodo ahụ. E dekwara ya nʼasụsụ Hibru, Griik na Latin. 21Ndịisi nchụaja nke ndị Juu gwara Pailet sị, “Edela na ọ bụ Eze ndị Juu, kama dee na nwoke a sịrị, abụ m eze ndị Juu.” 22Ma Pailet zara, “Ihe m dere, edeela m ya.” 23Mgbe ndị agha kpọgidechara Jisọs nʼobe, ha kere uwe ya ụzọ anọ. Onye ọbụla nʼime ha nwetara otu ụzọ. Ha chịrị uwe mwụda ya nke a na-adụghị adụ, kama a kpara ya akpa site nʼelu ya ruo nʼala ya. 24Ha gwarịtara onwe ha, “Ka anyị hapụnụ ịdọka ya, kama ka anyị fee nza lee onye ọ ga-adanyere i were ya.” Nke a bụ iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ha kere uwe m nʼetiti onwe ha, feekwa nza banyere uwe mwụda m.” Nke a bụ ihe ndị agha ahụ mere. 25Nne ya, nwanne ya nwanyị, bụ Meri nwunye Klopas, na Meri Magdalin guzo nso nʼakụkụ obe Jisọs. 26Mgbe Jisọs hụrụ nne ya na onye na-eso ụzọ ya ọ hụrụ nʼanya ka o guzo nʼakụkụ ya, ọ sịrị nne ya, “Nwanyị lee nwa gị nwoke.” 27Ọ sịrị onye ahụ nke na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị.” Site nʼoge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya laa nʼụlọ nke ya. 28Nʼikpeazụ, mgbe Jisọs matara na ihe niile emezuola. Ma iji mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, ọ sịrị, “Akpịrị na-akpọ m nkụ.” 29Otu ite mmanya ọra dọrọ nso nʼebe ahụ. Ha were ogbo denye nʼime mmanya ahụ, kenye ogbo ahụ nʼosisi hisọp welie ya elu chee ya nʼọnụ. 30Mgbe Jisọs detụrụ mmanya ahụ ọnụ, ọ sịrị, “Ọ gwụchaala.” O hulatara isi ya, kubie ume. 31Ma ndị Juu achọghị ka ahụ ndị ahụ a kpọgidere nʼobe nọgide nʼebe ahụ ka chi bọọ, nʼihi na ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe. Echi ya bụ ga-abụ ụbọchị izuike pụrụ iche. Ha rịọọrọ Pailet ka a gbajisie ha ụkwụ ma bupụkwa ahụ ha. 32Ndị agha ahụ bịara gbajie ụkwụ onye nke mbụ na onye nke ọzọ a kpọgburu ha na ya. 33Ma mgbe ha bịaruru nʼebe Jisọs nọ, ha hụrụ na ọ nwụọlarị. Nʼihi nke a, ha agbajighị ụkwụ ya. 34Kama otu onye nʼime ndị agha ahụ weere ùbe mapuo ya akụkụ ya. Ngwangwa ọbara na mmiri gbapụtara. 35Onye hụrụ ihe ndị a gbara ama ka unu kwere, ama ya bụ eziokwu, ọ matakwara na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. 36Ihe ndị a niile mere ka e mezuo ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, “Ọ dịghị ọkpụkpụ ya ọbụla nke a ga-agbaji.” 37E dekwara nʼebe ọzọ nʼakwụkwọ sị, “Ha ga-elegide onye ahụ ha mapuru ahụ anya.” 38Mgbe ihe ndị a gasịrị, otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere Arimatia, onye na-eso ụzọ Jisọs na nzuzo, nʼihi egwu ndị Juu, jekwuuru Pailet rịọ ka o nye ya ikike iburu ahụ Jisọs, Pailet kwere, ya mere ọ bịara buru ahụ ya. 39Nikọdimọs, onye ahụ bịakwutere Jisọs nʼabalị na mbụ, bịakwara. O wetara máá na aloos a gwakọtara agwakọta, nke ọtụtụ ya ruru ihe dịka kilogram iri atọ na anọ. 40Ha buuru ahụ Jisọs, tee ya ụda ndị ahụ, fụchikwaa ya nʼakwa ọcha linin dịka omenaala olili ozu nke ndị Juu si dị. 41Ebe ahụ a kpọgidere ya nʼobe dị nʼotu ubi a gbara ogige. Nʼime ogige a, otu ili ọhụrụ dị na ya nke e jibeghị lie onye ọbụla. 42Nʼihi na ọ bụ ụbọchị Nkwadebe nke ndị Juu, nakwa nʼihi na ili ahụ dị nso, ha dọnyere ahụ Jisọs nʼime ya.

Matiu

Mat 28:1–10

1Mgbe ụbọchị izuike gasịrị, nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nʼime izu ụka, Meri Magdalin na Meri nke ọzọ, gara ka ha lee ili ahụ. 2Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Nʼihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ, nọkwasịkwa nʼelu ya. 3Ihu ya na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka akụmmiri igwe. 4Nʼihi egwu ya, ndị nche makwara jijiji. Daa nʼala nọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ. 5Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ sị ha, “Unu atụla egwu, nʼihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nʼelu obe ka unu na-achọ. 6Ọ nọkwaghị nʼebe a. O sitela nʼọnwụ bilie, dị ka o si kwuo. Bịanụ lee ebe ọ tọgbọburu. 7Gaanụ ngwangwa gwa ndị na-eso ụzọ ya na e meela ka o si nʼọnwụ bilie. Lee, o burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya. Chetakwanụ ihe m gwara unu.” 8Ha ji oke egwu na ọṅụ pụọ ọsịịsọ site nʼili ahụ, gbara ọsọ gawa ịkọrọ ndị na-eso ụzọ ya. 9Na mberede, Jisọs zutere ha sị ha, “Ndeewonụ!” Ha bịakwutere ya, jide ụkwụ ya abụọ aka, kpọọkwa isiala nye ya. 10Ya mere Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Gaanụ, gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nʼebe ahụ.”

Mak

Mak 16:1–8

1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ. 2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ. 3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?” 4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ. 5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu. 6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya. 7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ” 8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.

Luk

Luk 24:1–12

1Nʼụbọchị mbụ nke izu ụka, nʼezigbo isi ụtụtụ, ha weere mmanụ otite ahụ ha tinyere ọtụtụ ụda nke ha kwadoro gawa nʼili ahụ. 2Ha chọpụtara na e nupụla nkume e ji dochie nʼọnụ ili ahụ. 3Ma mgbe ha banyere nʼime ya, ha ahụghị ahụ Onyenwe anyị Jisọs. 4Dị ka ha nọ na mgbagwoju anya banyere nke a, nʼotu ntabi anya, ha hụrụ mmadụ abụọ yi uwe na-egbu ka amụma guzo ha nso. 5Ha kpudoro ihu ha nʼala nʼihi oke egwu, ma mmadụ abụọ ahụ gwara ha, “Gịnị mere unu ji na-achọ onye dị ndụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ? 6Ọ nọkwaghị nʼebe a, o biliela nʼọnwụ, chetakwanụ ihe ọ gwara unu mgbe unu na ya nọ na Galili sị, 7‘A ghaghị inyefe Nwa nke Mmadụ nʼaka ndị mmehie, a ga-akpọgidekwa ya nʼobe ma nʼụbọchị nke atọ ọ ga-esi nʼọnwụ bilie.’ ” 8Mgbe ahụ ha chetara okwu ya. 9Mgbe ha sitere nʼili ahụ lọghachi, ha kọọrọ mmadụ iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a. 10Ọ bụ Meri Magdalin, na Joana, na Meri nne Jemis na ụmụ nwanyị ndị ọzọ so ha kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe a. 11Ma ha ekweghị ihe ha gwara ha, nʼihi na okwu ha dị ha ka ọ bụ ihe efu. 12Ma otu ọ dị, Pita gbaara ọsọ ruo nʼili ahụ, hulata ala hụ ka akwa ozu ndị ahụ tọgbọọrọ onwe ha; ọ lara na-atụgharị uche nʼime onwe ya ihe ihe ndị a pụtara.

Jọn

Jọn 20:1–18

1Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 2O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. 9(Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) 10Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha. 11Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs. 13Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” 14Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs. 15Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” 16Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)” 17Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ” 18Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile.

Ahụhụ ahụ na Matiu, Mak na Luk

Mat 26–27 · Mak 14–15 · Luk 22–23

Izu Nsọ

Soro ihe mere elekere site nʼelekere, dịka Oziọma si kọọ ha.

Sọnde Nkwụ

Mọnde nke Izu Nsọ · Mọnde Nsọ

Tiuzdee nke Izu Nsọ · Tiuzdee Nsọ

Wenezdee nke Izu Nsọ · Wenezdee Nsọ

Tọọzdee Nsọ

Fraịdee Ọma · Fraịdee Nsọ

Satọdee Nsọ

Sọnde Ista · Ista

N’ihe nkà

Ọrụ niile

Ememe ndị ọzọ

Ememe nke afọ chọọchị

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike