Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Disemba 2026 › 25 Disemba

Kalenda Katọlik

Ihe ọgụgụ Mass (Katọlik) — 25 Disemba 2026

Fraịdee · Oge Krismas

Mmemme na ndị nsọ

Ọmụmụ Onyenwe anyị (Krismas)

Mmemme ukwu · Agba ofufe: ọcha

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ihe ọgụgụ mbụ

Aịz 52:7–10

7Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwu bụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma, onye na-ekwusa okwu udo, e, onye na-eweta akụkọ ọma, onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta, onye na-asị Zayọn, “Lee, Chineke gị bụ eze!” 8Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu, ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ. Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn, ha ga-ahụ ya anya. 9Tienụ mkpu ọṅụ unu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem, nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi. Ọ gbapụtala Jerusalem. 10Onyenwe anyị ga-eme ka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ; ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwa nzọpụta Chineke anyị.

Abụ Ọma nzaghachi

Abụ 98:1–6

1Abụ Ọma. Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ, nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; aka nri ya na aka nsọ ya arụpụtarala ya nzọpụta. 2Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 3O chetala ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; nsọtụ nke ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị. 4Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ; 5werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma, 6jirinụ opi na opi ike, tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze.

Ihe ọgụgụ nke abụọ

Hib 1:1–6

1Na mgbe ochie, Chineke gwara nna nna anyị ha okwu nʼoge dị iche iche site nʼọnụ ndị amụma, na site nʼụzọ ndị ọzọ dị iche iche. 2Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. 3Ọ na-enwupụta ebube ya na-anọchitekwa anya ụdịdị ya, ebe o ji okwu ya dị ike na-ejikọta ihe niile. Mgbe ọ sachapụrụ ma hichapụkwa mmehie niile, ọ nọdụrụ nʼaka nri nke Onye dị ukwuu, dị elu nʼeluigwe. 4Ya mere, ọ bụrụla onye dị ukwu karịa ndị mmụọ ozi dị ka aha e nyere ya si dị elu karịa nke ha. 5Onye nʼetiti ndị mmụọ ozi ka ọ gwarala sị, “Ị bụ Ọkpara m. Taa abụrụla m Nna gị”? Maọbụ ọzọkwa, “Aga m abụrụ ya Nna, ya onwe ya ga-abụkwara m Nwa”? 6Ọzọkwa, mgbe o mere ka nwa mbụ ya bịa nʼụwa, o nyere iwu sị, “Ka ndị mmụọ ozi Chineke niile fee ya ofufe.”

Oziọma

Jọn 1:1–18

1Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke. 2Ya na Chineke nọ site na mbụ. 3E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya. 4Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile, 5ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya. 6Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. 7Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere. 8Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ. 9Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa. 10Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ. 11Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya. 12Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke. 13Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke. 14Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu. 15Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’ ” 16Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara. 17Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst. 18Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.

Kalenda Rom n’ozuzu; ọgbakọ ndị bishọp nwere ike ibuga ụfọdụ mmemme (Epifani, Mgbago n’Eluigwe, Ahụ na Ọbara Kraịst) n’ụbọchị Sọnde ma ọ bụ tinye nke ha. Akwụkwọ ọgụgụ: usoro Sọnde B, afọ ụbọchị izu I.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike