Ụlọ › Ememe nke afọ chọọchị › Oge Nchere
Ememe nke afọ chọọchị
Oge Nchere
Izu ndị tupu Krismas: na chọọchị ndị Ọdịda Anyanwụ, Oge Nchere na-amalite na Sọnde nke anọ tupu Krismas; na Chọọchị Ọtọdọks, ibu ọnụ Ọmụmụ nke ụbọchị iri anọ na-amalite na 15 Nọvemba nke kalenda chọọchị. Amụma na akụkụ Oziọma a na-agụ n’izu ndị a, zuru oke.
Ụbọchị
| Afọ | Chọọchị ndị Ọdịda AnyanwụSọnde mbụ nke Oge Nchere | Chọọchị ỌtọdọksMmalite ibu ọnụ Ọmụmụ |
|---|---|---|
| 2026 | 29 Novemba 2026Sọnde | 28 Novemba 2026Satọdee |
| 2027 | 28 Novemba 2027Sọnde | 28 Novemba 2027Sọnde |
| 2028 | 3 Disemba 2028Sọnde | 28 Novemba 2028Tiuzdee |
| 2029 | 2 Disemba 2029Sọnde | 28 Novemba 2029Wenezdee |
| 2030 | 1 Disemba 2030Sọnde | 28 Novemba 2030Tọọzdee |
Ụbọchị na-emeghe ihe ọgụgụ nke ụbọchị ahụ na kalenda Ọtọdọks ma ọ bụ Katọlik.
Ụbọchị Ọtọdọks dị ka kalenda Julian, nke Chọọchị Rọshịa, Sebia na Jọjịa na Ugwu Athos na-agbaso: ememe ha na-adịghị agbanwe na-adaba ụbọchị 13 ka e mesịrị na kalenda obodo. Chọọchị ndị kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria na ndị ọzọ) na-eme Krismas na 25 Disemba; a na-agụ Ista na ụbọchị ndị dabere na ya otu ụzọ ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Chọọchị Ọtọdọks niile.
Akụkụ Baịbụl
Aịzaya
1Kasịenụ ndị m obi, kasịenụ ha obi, ka Chineke gị kwuru. 2Were nwayọọ gwa Jerusalem okwu, gwa ya; na ụbọchị ọjọọ ya niile agwụla, na a kwụzuola ụgwọ mmehie ya niile, na o sitela nʼaka Onyenwe anyị nata ụgwọ ọrụ karịrị okpukpu abụọ nke mmehie ya niile. 3Otu onye na-eti mkpu sị, “Dozienụ ụzọ nye Onyenwe anyị nʼime ọzara, meenụ ka ụzọ atụliri atụli guzozie kwem nʼime ọzara nye Chineke anyị. 4A ga-eme ka ndagwurugwu ọbụla dị elu, ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala, ebe niile dị mkputamkpu ka a ga-eme ka o guzo kwem, meekwa ka ebe niile dị ndakoro ndakoro dịrị larịị. 5Nʼihi na a ga-ekpughepụ ebube Onyenwe anyị, mmadụ niile ga-ahụkọkwa ya nʼotu. Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.” 6Olu ahụ sịrị, “Tie mkpu!” Ma ajụrụ m sị, “Gịnị ka m ga-eti?” “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ikwesi ntụkwasị obi ha niile dịkwa ka okoko osisi ọhịa. 7Ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ, nʼihi nʼokuku ume nke Onyenwe anyị na-ekukwasị ya. Nʼezie, ahịhịa ka ndị mmadụ bụ. 8E, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko na-achanwụkwa, ma okwu Chineke anyị na-eguzogide ruo mgbe ebighị ebi.” 9Gị onye na-eweta oziọma nye Zayọn, rigoro nʼelu ugwu; gị onye na-eweta oziọma nye Jerusalem, welie olu gị elu tisie mkpu ike; e, tisie mkpu ike, atụla egwu. Gwa obodo niile nke Juda okwu sị ha: “Chineke unu na-abịa.” 10Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ. 11Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
Aịzaya
1Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ. 2Mmụọ Onyenwe anyị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu Onyenwe anyị. 3Ihe ga-amasị ya bụ egwu Onyenwe anyị. Ọ gaghị ekpe ikpe site naanị nʼihe o ji anya ya abụọ hụ, maọbụ gbubie ikpe site naanị nʼihe ọ nụrụ na ntị ya. 4Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ. 5Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya. 6Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha. 7Nne ehi na anụ ọhịa bịa ga-atakọkwa ahịhịa nʼotu ebe, ụmụ ha ga-amakpukọkwa nʼudo nʼotu ebe. Ọdụm ga-atakwa ahịhịa dịka ehi. 8Ụmụntakịrị ga-egwugharị egwu nʼakụkụ ọnụ ajụala; nwantakịrị ga-etinyekwa aka nʼakwụ ibi. 9Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke Onyenwe anyị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 10Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
Mak
1Mmalite oziọma maka Jisọs Kraịst, Ọkpara Chineke. 2Dịka e dere ya rịị nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, “Aga m ezipu onyeozi m nʼihu gị, onye ga-edozi ụzọ gị.” 3“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ” 4Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. 5Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. 6Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. 7O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. 8Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”
Luk
26Ma nʼọnwa isii ya, Chineke zigara mmụọ ozi ya, bụ Gebrel, ka ọ gaa nʼobodo Nazaret nke dị nʼime Galili. 27Ka o jekwuru otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke bụ onye otu nwoke aha ya bụ Josef, onye sitere nʼagbụrụ Devid, kwere nkwa ịlụ. Aha nwaagbọghọ a bụ Meri. 28O jekwuru ya sị ya, “Ekele! Gị onye ihuọma dịkwasịrị. Onyenwe anyị nọnyekwara gị.” 29Ma obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu nʼihi okwu ya. O bidokwara ịtụgharị nʼuche ya ihe ekele a pụtara. 30Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu Meri, nʼihi na i chọtala ihuọma nʼebe Chineke nọ. 31Ma lee ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa aha ya Jisọs. 32Ọ ga-abụ nnukwu mmadụ onye a ga-akpọ Ọkpara Onye kachasị ihe niile elu. Onyenwe anyị Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. 33Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” 34Meri sịrị mmụọ ozi ahụ, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe m bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke?” 35Mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye kachasị ihe niile elu ga-ekpuchikwa gị. Ya mere onye nsọ ahụ a ga-amụ, a ga-akpọ ya Ọkpara Chineke. 36Lekwa Elizabet onye ikwu gị atụrụla ime nwa nwoke nʼagadi ya. Nke a bụ ọnwa isii ya, bụ onye ahụ ha na-akpọ nwanyị aga. 37Nʼihi na ọ dịghị okwu sitere na Chineke nke na-agaghị ere.” 38Meri zaghachiri sị, “Abụ m ohu Onyenwe anyị, ka ọ dịrị m dị ka i kwuru.” Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya laa.
Luk
39Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. 40Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. 41Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. 42O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. 43Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? 44Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. 45Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” 46Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu 47mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, 48nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. 49Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. 50Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 51O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha. 52O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu. 53O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu. 54O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere. 55Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” 56Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya.
N’ihe nkà
Ozi Ọma nye MeriJan van Eyck · ihe dị ka 1434/1436
Nleta Meri, ya na Nsọ Nicholas na Nsọ Anthony AbbotPiero di Cosimo · ihe dị ka 1489/1490
Ọkwa Mmụọ Ozi nye MeriGustave Doré · 1866
Ozi Ọma nye MeriDürer · ihe dị ka 1503–5
Nleta MeriDürer · ihe dị ka 1504
Ozi Ọma nye MeriLucas van Leyden · ihe dị ka 1516
Nleta MeriLucas van Leyden · 1520
Peeji si nʼAkwụkwọ Awa Ekpere: Ozi Ọma e Zitere Meri (ihu)Onye osise Flanders a na-amaghị aha · 1470–1479
Peeji si nʼAkwụkwọ Awa Ekpere: Nleta MeriGuillaume Vrelant · ihe dị ka 1470–1480
Ozi Ọma nye Meri (L'annonciation)James Tissot · 1886–1894
Nleta Meri (La visitation)James Tissot · 1886–1894
Abụ Otuto Meri (Le magnificat)James Tissot · 1886–1894
Ememe ndị ọzọ
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike