Ụlọ › Ememe nke afọ chọọchị › Pentikọst
Ememe nke afọ chọọchị
Pentikọst
Ụbọchị iri ise mgbe Ista gasịrị: ọbịbịa nke Mmụọ Nsọ n’elu ndị na-eso ụzọ na Jerusalem, dị ka akwụkwọ Ọrụ Ndịozi si kọọ ya, ya na amụma Joel nke Pita hotara na okwu Jizọs n’Oziọma Jọn.
Ụbọchị
| Afọ | Chọọchị ndị Ọdịda AnyanwụPentikọọsụ | Chọọchị ỌtọdọksPentikọọsụ |
|---|---|---|
| 2027 | 16 Mee 2027Sọnde | 20 Jun 2027Sọnde |
| 2028 | 4 Jun 2028Sọnde | 4 Jun 2028Sọnde |
| 2029 | 20 Mee 2029Sọnde | 27 Mee 2029Sọnde |
| 2030 | 9 Jun 2030Sọnde | 16 Jun 2030Sọnde |
| 2031 | 1 Jun 2031Sọnde | 1 Jun 2031Sọnde |
Ụbọchị na-emeghe ihe ọgụgụ nke ụbọchị ahụ na kalenda Ọtọdọks ma ọ bụ Katọlik.
Ụbọchị Ọtọdọks dị ka kalenda Julian, nke Chọọchị Rọshịa, Sebia na Jọjịa na Ugwu Athos na-agbaso: ememe ha na-adịghị agbanwe na-adaba ụbọchị 13 ka e mesịrị na kalenda obodo. Chọọchị ndị kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria na ndị ọzọ) na-eme Krismas na 25 Disemba; a na-agụ Ista na ụbọchị ndị dabere na ya otu ụzọ ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Chọọchị Ọtọdọks niile.
Akụkụ Baịbụl
Ọrụ Ndị Ozi
1Mgbe ụbọchị Pentikọọsụ ruru, ha niile zukọtara nʼotu ebe. 2Na mberede, ụzụ yiri nke oke ifufe dị ike sitere nʼeluigwe bịa jupụta nʼụlọ ahụ ha nọ. 3Ha hụrụ ihe dịka ire ọkụ ka o kewara nọkwasị nʼisi ha nʼotu nʼotu. 4Ha niile jupụtara na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche dịka Mmụọ Nsọ nyere ha ike. 5Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ndị si na mba dị iche iche nʼokpuru eluigwe. 6Igwe mmadụ gbakọtara nʼọnọdụ mgbagwoju anya mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, nʼihi na ha nụrụ ka ha na-asụ asụsụ nke onye ọbụla nʼime ha na-aghọta, nʼasụsụ obodo ha dị iche iche. 7Nʼoke iju anya, ha kwurịtara nʼonwe ha, “Ndị a niile na-ekwu okwu ha abụghị ndị Galili? 8Gịnị mere onye ọbụla nʼime anyị ji na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ ala anyị dị iche iche? 9Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa, 10ndị Frigia, na ndị Pamfilia, na ndị Ijipt, na ndị akụkụ Libiya nke dị Sirini nso, na ndị ọbịa si na Rom bịa 11(ndị Juu na ndị kwere nʼokpukpe ndị Juu). Ndị Kriit na ndị Arab; anyị na-anụ okwu ha na-ekwu nʼasụsụ anyị dị iche iche banyere ọrụ ebube Chineke.” 12O juru ha anya, gbaakwa ha gharịị. Ha sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka nke a bụ?” 13Ma ụfọdụ ndị ọzọ na-akwa ha emo na-asị, “Ndị a bụ ndị mmanya na-egbu.” 14Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu. 15Ọ bụghị mmanya na-egbu ndị a dị ka unu chere. Lee, ọ bụ naanị elekere itoolu nke ụtụtụ na-akụ. 16Mba, nke a bụ mmezu ihe Juel onye amụma kwuru, 17“ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. 18Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma. 19Aga m egosi ihe ịtụnanya na mbara eluigwe, gosikwa ihe ịrịbama nʼụwa na nʼokpuru ụwa, ọbara na ọkụ na alulu anwụrụ ọkụ. 20Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa ebube. 21Ọ ga-erukwa, na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị, ka a ga-azọpụta.’
Juel
28“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. 29Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị. 30Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe, na nʼelu ụwa; a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ. 31Anyanwụ ga-agbanwe ghọọ ọchịchịrị, ọnwa ga-aghọkwa ọbara, tupu ụbọchị Onyenwe anyị abịa, bụ ụbọchị ahụ dị ukwu dịkwa oke egwu. 32Ọ ga-erukwa na onye ọbụla nke na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta. Nʼihi na ọ bụ nʼelu ugwu Zayọn, na nʼime Jerusalem ka mgbapụta ga-adị, dịka Onyenwe anyị kwuru ya. Mgbapụta a ga-adịkwara ndị fọdụrụ ndụ, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị na-akpọ.
Jọn
37Nʼụbọchị ikpeazụ bụkwa ụbọchị kacha ibe ya nke mmemme ahụ, Jisọs guzooro ọtọ jiri oke olu tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọbụla nkụ, ya bịakwute m bịa ṅụrụ mmiri. 38Onye ọbụla kweere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwururị, isi iyi mmiri nke ndụ ga na-asọpụta site nʼime afọ ya.” 39O kwuru nke a banyere Mmụọ ahụ ndị kwere na ya ga-anata. Tutu ruo oge ahụ, e nyebeghị Mmụọ ahụ, nʼihi na e nyebeghị Jisọs otuto.
Jọn
19Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.”
N’ihe nkà
PentikọọsụDürer · ihe dị ka 1509/1510?
Mbịakwasị nke Mmụọ NsọGustave Doré · 1866
Ndị Ozi Na-ekwusa OziGustave Doré · 1866
PentikọstOnye osise Jamanị · etiti narị afọ nke 13
Kraịst Pụtara Ihe nye Ndị OziRembrandt · 1656
Kraịst Gosiri Onwe Ya nʼỌnụụlọ Elu (Apparition du Christ au cénacle)James Tissot · 1886–1894
Ememe ndị ọzọ
Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike