Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ememe nke afọ chọọchị › Oge Lent

Ememe nke afọ chọọchị

Oge Lent

Ụbọchị iri anọ nke ibu ọnụ tupu Ista: na chọọchị ndị Ọdịda Anyanwụ site na Wenezde Ntụ, na Chọọchị Ọtọdọks site na Mọnde Dị Ọcha. Ibu ọnụ Jizọs n’ọzara na okwu ya banyere inye onyinye ebere, ekpere na ibu ọnụ, zuru oke.

Ụbọchị

AfọChọọchị ndị Ọdịda AnyanwụWenezde NtụChọọchị ỌtọdọksMọnde Dị Ọcha
202710 Febrụwarị 2027Wenezdee15 Maachị 2027Mọnde
20281 Maachị 2028Wenezdee28 Febrụwarị 2028Mọnde
202914 Febrụwarị 2029Wenezdee19 Febrụwarị 2029Mọnde
20306 Maachị 2030Wenezdee11 Maachị 2030Mọnde
203126 Febrụwarị 2031Wenezdee24 Febrụwarị 2031Mọnde

Ụbọchị na-emeghe ihe ọgụgụ nke ụbọchị ahụ na kalenda Ọtọdọks ma ọ bụ Katọlik.

Ụbọchị Ọtọdọks dị ka kalenda Julian, nke Chọọchị Rọshịa, Sebia na Jọjịa na Ugwu Athos na-agbaso: ememe ha na-adịghị agbanwe na-adaba ụbọchị 13 ka e mesịrị na kalenda obodo. Chọọchị ndị kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria na ndị ọzọ) na-eme Krismas na 25 Disemba; a na-agụ Ista na ụbọchị ndị dabere na ya otu ụzọ ahụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ Chọọchị Ọtọdọks niile.

Akụkụ Baịbụl

Juel

Jul 2:12–17

12“Ọ bụladị ugbu a,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Jirinụ obi unu niile lọghachikwute m. Werekwanụ obubu ọnụ, na ịkwa akwa, na iru ụjụ, lọghachikwutenụ m.” 13Dọwakwaanụ obi unu, ọ bụghị uwe unu. Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihi na ọ bụ onye na-eme amara, na onye obi ebere. Ọ bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ. O jupụtara nʼịhụnanya. Ọ naghị eme ọsịịsọ nʼinye ntaramahụhụ. 14Onye maara? Ma eleghị anya ọ ga-alọghachite azụ tụgharịa obi ya, hapụrụ anyị ngọzị ya, kwe ka eweta onyinye mkpụrụ ubi na onyinye ihe ọṅụṅụ maka Onyenwe anyị bụ, Chineke unu. 15Fụọ opi ike nʼime Zayọn. Kpọsaa obubu ọnụ dị nsọ. Kpọkọta nzukọ dị nsọ. 16Chịkọtaa onye ọbụla, doo nzukọ ahụ nsọ, ma ndị okenye, ma ụmụntakịrị, ma ụmụ na-aṅụ ara. Kpọpụta nwoke lụrụ nwunye ọhụrụ site nʼụlọ ya, ya na nwaagbọghọ lụrụ dị ọhụrụ site nʼebe nzuzo ya. 17Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”

Matiu

Mat 4:1–11

1Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. 2Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. 3Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” 4Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’ ” 5Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu, 6sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’” 7Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa.’ ” 8Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha. 9Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.” 10Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ” 11Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi.

Matiu

Mat 6:1–6, 16–21

1“Kpacharanụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu naanị ka ndị mmadụ hụ unu. Nʼihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọbụla site nʼaka Nna unu bi nʼeluigwe. 2“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke. 3Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime. 4Ka onyinye gị bụrụ na nzuzo. Mgbe ahụ, Nna gị, onye na-ahụ ihe dị na nzuzo ga-akwụghachi gị. 5“Mgbe ọbụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ihu abụọ, nʼihi na ha hụrụ iguzo nʼime ụlọ ekpere, nakwa nʼakụkụ ụzọ nʼanya na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha. Nʼezie, agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼebe o zuruoke. 6Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nʼime ime ụlọ unu. Mechiekwanụ ụzọ unu, kpọkuonụ Nna unu nʼekpere na nzuzo. Mgbe ahụ Nna unu, onye na-ahụ ihe e mere na nzuzo, ga-enye unu ụgwọ ọrụ unu. 16“Ọzọ, mgbe ọbụla unu na-ebu ọnụ, unu agbarụla ihu unu dịka ndị ihu abụọ na-eme. Nʼihi na ha na-agbarụ ihu ha ka ndị ọzọ hụ na ha na-ebu ọnụ. Nʼezie agwa m unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha. 17Mgbe ị na-ebu ọnụ, tee isi gị mmanụ, ma saakwa ihu gị mmiri, 18ka ndị ọzọ ghara ịhụta na ị na-ebu ọnụ kama ka ọ bụrụ naanị nye Nna gị, onye anya na-adịghị ahụ. Nna gị, onye na-ahụ ihe niile na-eme na nzuzo, ga-akwụ gị ụgwọ. 19“Unu akpadola akụ nʼụwa nye onwe unu, ebe ọ ga-agba nchara, akịka atakwa ya, ebe ndị ohi ga-etiwa ma zukwaa ha. 20Kama kwadoonụ akụ nʼeluigwe nye onwe unu, ebe ha na-agaghị agba nchara, ebe akịka na-agaghị eri ha, ebe ndị ohi na-adịghị etiwa maọbụ zuo ihe. 21Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.

N’ihe nkà

Ọrụ niile

Ememe ndị ọzọ

Ememe nke afọ chọọchị

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike