Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Ihe ọgụgụ Baịbụl kwa ụbọchị › Jenụwarị 2027 › 7 Jenụwarị

Kalenda Ọtọdọks · 25 Disemba (Kalenda ochie)

Ihe ọgụgụ Ọtọdọks nke ụbọchị — 7 Jenụwarị 2027

Tọọzdee · Izu nke 32 mgbe Pentikọọsụ gasịrị · Olu 6

Mmemme na ndị nsọ

The Nativity of our Lord God and Savior Jesus Christ

Oge Krismas (Svyatki)

Ọ dịghị obubu ọnụ

Nke a na-eso iwu ndị mọnk. Nʼparish, a na-ekpebi ọtụtụ obubu ọnụ ya na onye na-anụ nkwupụta mmadụ, dịka ahụike, afọ na ọnọdụ si dị.

Ihe ọgụgụ nke ụbọchị

Ofufe ụtụtụ: Oziọma

Mat 1:18–25

18Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ. 19Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo. 20Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye gị, nʼihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nʼike Mmụọ Nsọ. 21Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha.” 22Ihe ndị a mere iji mezuo ihe ahụ Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onye amụma ya sị, 23“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”). 24Mgbe Josef si nʼụra teta, o mere dịka mmụọ ozi Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwunye ya. 25Ma ha abụọ edinakọghị tutu ruo mgbe ọ mụsịrị nwa nwoke, onye ọ kpọrọ aha ya Jisọs.

Akwụkwọ ozi (maka Ọmụmụ)

Gal 4:4–7

4Ma mgbe oge a kara aka ruru, Chineke zitere Ọkpara ya, bụ onye amụrụ site na nwanyị, onye amụrụ nʼokpuru iwu, 5ka ọ gbapụta ndị nọ nʼokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ a họpụtara. 6Ebe unu bụ ụmụ, Chineke zitere Mmụọ Ọkpara ya, ka ọ bịa biri nʼobi anyị, na-eti mkpu na-asị, “Abba, Nna.” 7Ugbu a, ị bụkwaghị ohu, kama ị bụ nwa. Ebe ị bụ nwa, e meekwala ka ị bụrụ onye nketa site na Chineke.

Oziọma (maka Ọmụmụ)

Mat 2:1–12

1Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem, 2na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.” 3Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem. 4Mgbe ọ kpọkọtara ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu niile, ọ jụrụ ha, olee ebe e kwuru na a ga-amụ Kraịst ahụ. 5Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, 6“ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’” 7Mgbe ahụ Herọd kpọrọ ndị amamihe ahụ na nzuzo jụpụta ha banyere oge kpakpando ahụ ji pụta ìhè. 8O zipụrụ ha ije Betlehem sị ha, “Gaanụ lee anya nke ọma chọpụta ebe nwantakịrị ahụ nọ. Mgbe unu chọtara ya, bịanụ mee ka m mara, ka m gaakwa kpọọ isiala nye ya.” 9Mgbe ha nụrụ okwu eze, ha pụrụ gawa, ma kpakpando ahụ ha hụrụ nʼọwụwa anyanwụ pụtakwara ọzọ, na-aga nʼihu ha ruo mgbe ọ bịara guzo nʼelu ebe nwantakịrị ahụ nọ. 10Ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ha hụrụ kpakpando ahụ. 11Ka ha banyere nʼụlọ ahụ, ha hụrụ nwantakịrị ahụ na nne ya Meri, ha gburu ikpere nʼala ma kpọọrọ ya isiala. Ha meghere akpa akụ ha nye ya onyinye ọlaedo na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ a na-akpọ frankisens, ya na máá. 12Nʼihi na a dọrọ ha aka na ntị na nrọ ka ha ghara ịlaghachikwuru Herọd, ha sitere nʼụzọ ọzọ laghachi obodo ha.

Ụbọchị ndị a na-eso kalenda Julian nke Nzukọ Rọshịa (dịka Nzukọ Sabia na Jọjia na Ugwu Athos): 25 Disemba na kalenda nzukọ bụ 7 Jenụwarị na kalenda obodo. Nzukọ ndị na-eji kalenda ọhụrụ (Gris, Romania, Bulgaria, Ukraine…) na-eme mmemme ndị na-adịghị agbanwe agbanwe na ndị nsọ n’ụbọchị obodo ahụ n’onwe ya, ụbọchị 13 tupu mgbe ahụ, ụfọdụ ihe ọgụgụ ha dịkwa iche; Ista na ụbọchị ndị dabere na ya bụ otu.

Isi mmalite: Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike