Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Mkpughe 21:4
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Mkpughe 21:4
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”
N’ọnọdụ ya
1Mgbe ahụ, ahụrụ m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Eluigwe nke mbụ na ụwa nke mbụ agabigala, osimiri adịghịkwa.
2Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.
3Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.
4Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”
5Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”
6Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye.
7Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m.
N’asụsụ Bekee
‘He will wipe away every tear from their eyes,’ and there will be no more death or mourning or crying or pain, for the former things have passed away.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya.Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’ ‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’”Onye iro ikpeazụ a ga-emeri bụ ọnwụ.Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha. Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha. Iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.Anwụ gị agaghị ada ada, ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha; nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile, iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.Ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa. Ha ga-eji abụ bata na Zayọn; ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha, oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha, iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ. Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike