Bible Explorer

Ụlọ › Ihe Baịbụl kwuru › Ikpe ọmụma na ihere

Mmetụta

Ihe Baịbụl kwuru banyere Ikpe ọmụma na ihere

Amaokwu ndị na-agụ ya na-elekarị anya maka isiokwu a (13), e hotara ha nʼuju site na Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a.

1Jọn 1:9Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.
Rom 8:1Ya mere, ikpe ọmụma ọbụla adịghịkwa ugbu a nye ndị niile nọ nʼime Jisọs Kraịst.
Aịz 54:4“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.
Rom 3:23Nʼihi na mmadụ niile emehiela ha ekwesikwaghị otuto Chineke.
Aịz 61:7Nʼọnọdụ ihere dịịrị ha ugbu a, ndị m ga-enweta ngọzị okpukpu abụọ, nʼọnọdụ nkọcha dịịrị ha ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ihe nketa ha nwetara. Ha ga-enweta okpukpu ihe nketa ala abụọ, ketakwa ọṅụ nke ga-adịgidere ha ruo mgbe ebighị ebi.
1Jọn 2:1Ezi ụmụntakịrị m, ana m edere unu ihe ndị a ka unu ghara imehie. Ma ọ bụrụ na onye ọbụla emehie, anyị nwere onye na-ekwuchite ọnụ anyị nʼihu Nna ahụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst, Onye ezi omume ahụ.
Abụ 34:4–5Nʼihi na etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, ọ zakwara m, napụta m site nʼaka ịtụ ụjọ m niile. Ihu ndị na-elekwasị ya anya na-enwu dịka ihe; ihere adịghị eme ha.
Hib 12:2Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.
Rom 10:11Dịka akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ọbụla kweere na ya, agaghị eme ka ihere mee ya.”
Rom 5:1Ya mere, ebe e sitere nʼokwukwe mee ka anyị bụrụ ndị a gụrụ dịka ndị ezi omume, udo dị ugbu a nʼetiti anyị na Chineke site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Mai 7:19Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
Ọrụ 8:22Si nʼajọ omume gị chegharịa, rịọ Onyenwe anyị arịrịọ ma eleghị anya ọ ga-agbaghara gị echiche ọjọọ niile nke obi gị.
Luk 15:7Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa.

Ndị a bụ amaokwu ndị na-agụ na-achọkarị maka isiokwu a — ọ bụghị nkuzi banyere ya. Gụọ nke ọ bụla n'isiakwụkwọ ya.

Isi mmalite

Amaokwu nke isiokwu ọ bụla na usoro ha: data isiokwu nke OpenBible.info, dịka votu ndị na-agụ ya si dị: OpenBible.info · CC BY 4.0

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible.