Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Filipai 4:19
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Filipai 4:19
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.
Gụọ isi ahụ dum: Ndị Filipai 4
N’ọnọdụ ya
16Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m.
17Ọ bụghịkwa na m chọrọ onyinye unu, kama ana m achọ ka mkpụrụ unu ga-amịta baa ụba, bara unu uru.
18Ugbu a, enweela m ihe niile na-akpa m mkpa, nʼezie, enweela m karịa ihe na-akpa m. Onyinye unu nyere m, nke Epafroditọs wetara, egboola mkpa m niile. Onyinye ndị a dị ka aja na-esi isi ụtọ a chụụrụ Chineke, nke ọ na-anabatakwa nke ọma.
19Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu niile, site nʼụlọakụ ebube ya nke eluigwe, nʼihi Kraịst Jisọs.
20Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
21Keleere m ndị nsọ niile nʼime Kraịst Jisọs. Ụmụnna ndị mụ na ha nọ na-ekelekwa unu.
22Ndị nsọ niile nọ nʼebe a na-ekele unu, karịsịa ndị nọ nʼụlọ Siza.
N’asụsụ Bekee
And my God will supply all your needs according to His glorious riches in Christ Jesus.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma. Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba. Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.Onyenwe anyị Chineke bụ anyanwụ na ọta; Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ.Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi.Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ.Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto, ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya. A sịkwarị na m na-aga ije, na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ, agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla; nʼihi na ị nọnyeere m, mkpọrọ gị na mkpanaka gị na-akasị m obi. Ị na-akwado tebul nʼihu m, nʼanya ndị iro m. I tere isi m mmanụ iko m na-ejubiga oke.Ma mụ onwe m, ana m ele Onyenwe anyị anya nʼihi inyeaka ya. Eji m olileanya na-echere Chineke Onye nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m.Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị. Mgbe ahụ ka ọ ga-eme ka ọba gị niile jubigakwa oke, ebe ịnara mmanya gị ga-ejupụta na mmanya ọhụrụ.E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike