Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 31:30

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ilu 31:30

Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.

Gụọ isi ahụ dum: Ilu 31

N’ọnọdụ ya

27Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.

28Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.

29Ọ ga-asị; “E nwere ọtụtụ ndị inyom ndị bụ ezi nwunye nye di ha, ma gị onwe gị kachasị ha niile mma.”

30Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.

31E kwesiri ito ya nʼihi ọrụ ọma niile nke aka ya rụpụtara. Ka ọrụ ya niile wetara ya otuto nʼọnụ ụzọ ama nke obodo.

Ilu 31

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleProverbs 31:30Charm is deceptive and beauty is fleeting, but a woman who fears the LORD is to be praised.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 1:7Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma. Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
1Pt 3:4–5Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke. Nke a bụ ụzọ ndị inyom mgbe ochie, bụ ndị dị nsọ, ndị olileanya ha dị nʼime Chineke siri chọọ onwe ha mma. Ha debekwara onwe ha nʼokpuru di nke aka ha.
Ilu 11:22Nwanyị mara mma, nke na-enweghị uche, dịka ọlaedo a gbanyere ezi nʼimi.
Ilu 8:13Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.
1Pt 1:24Nʼihi na, “Mmadụ niile dị ka ahịhịa, ma ebube ha niile dị ka okoko osisi nke ọhịa, ahịhịa na-akpọnwụ, okoko osisi na-achanwụ,
1Kọ 4:5Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.
Est 1:11–12sị ha gaa kpọọ Vashti nwunye eze ka ọ bịakwute ya. Eze nyekwara iwu ka Vashti kpuru okpueze nʼisi ya, maka igosi ndị mmadụ niile na ndị a na-asọpụrụ nọ nʼebe ahụ ịma mma ya. Nʼihi na Vashti mara mma. Ma mgbe e mere ka ozi eze ruo ya ntị, eze nwanyị, bụ Vashti jụrụ ịbịa. Nke a mere ka iwe wee eze nke ukwuu.
Abụ 147:11Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike