Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Joshua 1:9
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Joshua 1:9
Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”
N’ọnọdụ ya
6Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie.
7“Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga.
8Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma.
9Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”
10Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha,
11“Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’ ”
12Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị,
N’asụsụ Bekee
Have I not commanded you to be strong and courageous? Do not be afraid; do not be discouraged, for the LORD your God is with you wherever you go.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.”Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu. Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.Abụ Ọma Devid. Onyenwe anyị bụ ìhè m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.Mgbe i pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na i lee anya hụ na ndị iro gị nwere ọtụtụ ịnyịnya, ụgbọ agha na ndị agha dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa gị, unu atụla egwu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị, onye ahụ mere ka i si nʼala Ijipt pụta nʼudo, nọnyeere gị.Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị; Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. SelaMgbe ahụ, Mosis kpọrọ Joshua, gwa ya okwu nʼihu ụmụ Izrel, sị ya, “Dị ike! Nwee obi ike! Nʼihi na ọ bụ gị ga-edu ndị a baa nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụrụ iyi inye nna nna ha, ị ga-emekwa ka ha keta ala a dịka ihe nketa ha. Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.”Ma ugbu a, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, bụ onye kere gị, Jekọb, na onye kpụrụ gị Izrel, “Atụla egwu, nʼihi na agbapụtala m gị. Akpọọla m gị aha, ị bụkwa nke m.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike