Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 16:9

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ilu 16:9

Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.

Gụọ isi ahụ dum: Ilu 16

N’ọnọdụ ya

6Ọ bụ site nʼịhụnanya na eziokwu ka eji ekpuchi mmehie; ọ bụkwa site nʼegwu Onyenwe anyị ka mmadụ ji agbanarị mmehie.

7Mgbe ụzọ mmadụ na-agbaso na-atọ Onyenwe anyị ụtọ, ọ na-eme ka mmadụ ahụ na ndị iro ya dị nʼudo.

8Ọ dị mma inwe ihe nta nʼezi omume karịa inwe ọtụtụ uru nʼụzọ ikpe na-ezighị ezi.

9Anyị nwere ike pịa ọpịpịa nʼobi anyị, maọbụ Onyenwe anyị na-edu ije anyị.

10Egbugbere ọnụ eze na-ekwu okwu sitere na-ezi nghọta, ọnụ ya adịghị ekpe ikpe na-ezighị ezi.

11Ihe ọtụtụ ziri ezi na ihe niile ha nʼotu dịrị Onyenwe anyị, ihe niile e ji atụ ihe dị nʼime akpa bụ ya mere ha.

12Ndị eze kpọrọ ime ihe na-adịghị mma asị, nʼihi na site nʼezi omume ka ocheeze ji eguzosi ike.

Ilu 16

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleProverbs 16:9A man’s heart plans his course, but the LORD determines his steps.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ilu 19:21Ọtụtụ atụmatụ dị nʼobi mmadụ; maọbụ uche Onyenwe anyị ga-emezu.
Abụ 37:23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike;
Ilu 16:1Mmadụ nwere ike pịa ihe ọ chọrọ ime, ma okwu ikpeazụ ga-esi nʼọnụ Onyenwe anyị.
Ilu 20:24Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?
Jer 10:23O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.
Ilu 21:30O nweghị amamihe dị, o nweghị nghọta dị, o nwekwaghị atụmatụ ọbụla, nke pụrụ iguzosi ike megide Onyenwe anyị.
Aịz 46:10Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite, ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu. Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide. Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike