Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ilu 3:5–6
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ilu 3:5–6
5Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.
6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
N’ọnọdụ ya
2Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu.
3Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
4Mgbe ahụ, ị ga-enwe ihuọma na ezi aha nʼanya Chineke na nʼihu mmadụ.
5Tụkwasị Onyenwe anyị obi gị niile, adaberekwala na nghọta gị.
6Nʼihe ọbụla ị na-eme, ka Chineke bute ụzọ, ọ ga-eduzi gị, meekwa ka okporoụzọ gị niile gazie.
7A bụla onye maara ihe nʼanya nke onwe gị. Tụọ Onyenwe anyị egwu, kpọọkwa ihe ọjọọ asị.
8Nke a ga-eme ka i nwee ahụ ike gbaakwa ọkpụkpụ gị ume.
9Sọpụrụ Onyenwe anyị site nʼinye ya mkpụrụ mbụ nke akụnụba gị, na mkpụrụ mbụ nke ihe ubi gị.
N’asụsụ Bekee
Trust in the LORD with all your heart, and lean not on your own understanding; in all your ways acknowledge Him, and He will make your paths straight.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nyefee onwe gị nʼaka Onyenwe anyị; tụkwasị ya obi, ọ ga-emere gị nke a:“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya. Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị. Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ. Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ, akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya. Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị. Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”Nwoke ahụ na-atụkwasị onwe ya obi bụ onye nzuzu! Ma ndị na-agbaso amamihe Chineke, aka adịghị akpa ha.Tụkwasị Onyenwe anyị obi meekwa ihe ziri ezi; biri nʼala na nchebe, rijuokwa afọ.Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; kwupụtaranụ ya obi unu, nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. SelaỊ na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha. Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi.Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”Dere duu nʼihu Onyenwe anyị, were ndidi chere ya; echegbula onwe gị mgbe ndị ọzọ na-enwe ọganihu, mgbe ha na-emezu atụmatụ ọjọọ ha niile.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike