Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Timoti 6:10
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Timoti 6:10
Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.
N’ọnọdụ ya
7Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ.
8Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere.
9Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi.
10Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.
11Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ.
12Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe.
13Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu
N’asụsụ Bekee
For the love of money is the root of all kinds of evil. By craving it, some have wandered away from the faith and pierced themselves with many sorrows.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ, na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta. Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.Aghaghị ịkwụsị ha maka na ha na-akụzi ihe ha ekwesighị ikuzi nʼihi ego, si otu ahụ na-eme ka ọtụtụ ezinaụlọ gbasaa.Ha bụ nkịta na-eribiga nri oke; ha adịghị enwe afọ ojuju. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ na-enweghị nghọta, ha niile echela ihu nʼụzọ nke aka ha, onye ọbụla na-agbalịsị ike ịchọta uru nke ya.Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora.Ndịisi ya na-ekpe ikpe nʼihi ngarị, ndị nchụaja ya na-akụzi ihe nʼihi ụgwọ, ebe ndị amụma ya na-ajụta ase nʼihi ego. Ma ha dabere na Onyenwe anyị na-asị, “ Onyenwe anyị ọ nọnyeereghị anyị? O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị anyị.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike