Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Samuel 16:7
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Samuel 16:7
Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”
N’ọnọdụ ya
4Samuel mere ihe Onyenwe anyị kwuru. Mgbe o rutere na Betlehem, ndị okenye obodo ahụ ji ịma jijiji pụta izute ya. Ha jụrụ ya sị “Ọ dịkwa mma? Udo ọ dịkwa?”
5Ma Samuel zara ha sị “E, udo dị, Abịara m ịchụrụ Onyenwe anyị aja. Doonụ onwe unu nsọ bịa soro m gaa ịchụ aja ahụ.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị ikom nsọ, gwakwa ha ka ha soro gaa.
6Mgbe ha ruru, Samuel hụrụ Eliab kwuo nʼobi ya sị, “Nʼezie, onye nke Onyenwe anyị tere mmanụ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.”
7Ma Onyenwe anyị zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. Onyenwe anyị adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma Onyenwe anyị na-ele anya nʼobi.”
8Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “ Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
9Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba Onyenwe anyị ahọrọghị onye a.”
10Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “ Onyenwe anyị ahọrọghị ndị a.”
N’asụsụ Bekee
But the LORD said to Samuel, “Do not consider his appearance or height, for I have rejected him; the LORD does not see as man does. For man sees the outward appearance, but the LORD sees the heart.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Kwụsịnụ ikpe ikpe site nʼihe anya na-ahụ, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi, na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ, nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị, na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”Ọ sịrị ha, “Unu na-egosi onwe unu dị ka ndị ezi omume nʼihu ndị mmadụ ma Chineke maara obi unu. Nʼihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị oke mkpa bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Chineke.Kama, ka ịchọ mma unu bụrụ mmadụ nke ime mmụọ, nke mma ya na-adịghị aṅacha, nke bụ mmụọ ịdị nwayọọ na ịdị juu. Nke dị oke ọnụahịa nʼihu Chineke.“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu, ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile, otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.Ụzọ niile nke mmadụ dị ọcha nʼanya ya, ma Onyenwe anyị na-atule ebumnobi niile nke mmadụ.Ịma mma nke elu ahụ adịghị egosi ihe mmadụ bụ, nʼihi na ịma mma adịghị adịgide ogologo oge. Ma nwanyị ọbụla nke na-atụ egwu Onyenwe anyị bụ onye e kwesiri ito.Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ. Onyenwe anyị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike