Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Jọn 1:9

Amaokwu Baịbụl · IGCB

1 Jọn 1:9

Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.

Gụọ isi ahụ dum: 1 Jọn 1

N’ọnọdụ ya

6Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị.

7Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.

8Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị.

9Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.

10Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị.

1 Jọn 1

N’asụsụ Bekee

Berean Standard Bible1 John 1:9If we confess our sins, He is faithful and just to forgive us our sins and to cleanse us from all unrighteousness.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Abụ 32:5Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
Ilu 28:13Onye na-ezo mmehie ya agaghị enwe ọganihu na ndụ ya. Ma onye na-ekwupụta mmehie ya hapụkwa ha, ka a ga-emere ebere.
Jer 33:8Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.
Abụ 51:2–5Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
Izk 36:25Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile.
Hib 10:23Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.
1Tm 1:15Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike