Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Timoti 3:16
Amaokwu Baịbụl · IGCB
2 Timoti 3:16
Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:
N’ọnọdụ ya
13Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.
14Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nʼihe ịmụtara na ihe i kwenyesịrị ike na ya, ebe ị maara onye i si nʼaka ya mụta ha.
15Ị maara na ọ bụ site nʼoge ị bụ nwantakịrị ka ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ jiri doo gị anya, nke nwere ike ikuziri gị maka nzọpụta site nʼokwukwe i nwere nʼime Kraịst Jisọs.
16Ihe niile dị nʼakwụkwọ nsọ bụ ihe si nʼuche Chineke pụta. Ha bara uru maka izi anyị ihe, igosi erughị eru anyị, ịtụziri anyị aka nʼụzọ dị mma, na ịzụ anyị nʼụzọ ezi omume:
17ka onye nke Chineke zuo oke, dịkwa njikere maka ịrụ ezi ọrụ niile ọbụla.
N’asụsụ Bekee
All Scripture is God-breathed and is useful for instruction, for conviction, for correction, and for training in righteousness,Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na ihe niile edere nʼoge gara aga bụ iji kuziere anyị ihe, ka anyị nwee ike isite na ntachiobi nakwa nkasiobi, nke dị nʼakwụkwọ nsọ nwee olileanya.Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu. Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị. Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.Jisọs zara ha sị, “Ọ bụ na unu adịghị ejehie ụzọ nʼihi na unu aghọtaghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, maọbụ ike Chineke?Iwu Onyenwe anyị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ Onyenwe anyị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Iwu Onyenwe anyị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu Onyenwe anyị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè. Ịtụ egwu Onyenwe anyị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ. Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha.Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ,Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị.kwusaa okwu ahụ mgbe niile; dịkwa njikere, mgbe o kwesiri ekwesi na mgbe ọ na-ekwesighị, jiri ya nye ntụziaka, jiri ya baa mba, jirikwa ya gbaa ndị mmadụ ume, site na ntachiobi na ilezi anya inye ezi ndụmọdụ.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike