Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 1 Pita 2:16
Amaokwu Baịbụl · IGCB
1 Pita 2:16
Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke.
N’ọnọdụ ya
13Werenụ onwe unu nyefee, nʼihi Onyenwe anyị, nʼokpuru ọchịchị niile e guzobere nʼetiti ụmụ mmadụ, ma ọchịchị ahụ ọ bụ nke eze, dịka onye ike ya kacha nke ibe ya,
14maọbụ nke ọchịchị gọvanọ, onye e guzobere nʼihi ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ, na ito ndị na-eme ezi ihe otuto.
15Nʼihi na ọ bụ uche Chineke na unu ga-esite nʼezi ọrụ unu kpuchie ọnụ ndị ahụ na-esite na-amaghị ihe ha, na-ekwu okwu nzuzu.
16Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nwere onwe ha, ma unu ejikwala mnwere onwe unu mere ihe mkpuchi nke ajọ ihe. Bienụ dịka ụmụodibo Chineke.
17Sọpụrụnụ mmadụ niile dịka o si kwesi. Gosi ndị niile kwere ekwe ịhụnanya. Tụọ Chineke egwu, ma na-asọpụrụ eze.
18Ndị ohu, ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye naanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obiọma nʼebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri.
19Nʼihi na nke a bụ ihe inye ekele ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachiobi na-edi ahụhụ na-ezighị ezi na-adakwasị unu, nʼihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ.
N’asụsụ Bekee
Live in freedom, but do not use your freedom as a cover-up for evil; live as servants of God.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo.Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi.Nʼihi na onye ọbụla Onyenwe anyị Chineke kpọrọ mgbe o bụ ohu, aghọọla onye nweere onwe ya nʼime Onyenwe anyị. Otu aka ahụ, onye nwerela onwe ya mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ya aghọọla ohu nke Kraịst.Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike