Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Matiu 6:24
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Matiu 6:24
“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.
N’ọnọdụ ya
21Nʼihi na ebe ọbụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
22“Anya bụ oriọna nke anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, ahụ gị niile ga-ejupụta nʼìhè.
23Ọ bụrụ na anya gị ajọọ njọ, akụkụ ahụ gị niile ga-ejupụta nʼọchịchịrị. Ọ bụrụkwa na ìhè ahụ dị nʼime gị aghọọ ọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adị ukwuu.
24“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.
25“Nʼihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ ihe unu ga-aṅụ, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi nʼahụ. Ọ bụ ndụ akarịghị nri eji azụ ya, ka ọ bụ ahụ akarịghị ihe e ji ekpuchi ya?
26Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịmaatụ. Ha adịghị akụ mkpụrụ nʼubi maọbụ ewe ihe ubi. Ha adịghị achịkọtakwa ihe debe nʼọba. Ma Nna unu nke bi nʼeluigwe na-azụ ha. Ọ bụ na unu adịghị oke ọnụahịa karịa ha?
27Onye nʼetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya?
N’asụsụ Bekee
No one can serve two masters: Either he will hate the one and love the other, or he will be devoted to the one and despise the other. You cannot serve both God and money.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya. Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.“Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nʼihi na ọ ga-achọ ịhụ otu nʼime ha nʼanya, kpọkwa nke ọzọ asị, maọbụ, sọpụrụ otu ma lelịa nke ọzọ anya. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na akụ otu mgbe ahụ.”Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi. Nʼihi na ịhụ ego nʼanya bụ mgbọrọgwụ nke ime ihe ọjọọ niile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nʼanya, ndị na-achọsi ya ike, adapụla nʼokwukwe ha, si otu a tinye onwe ha nʼọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru ụjụ.Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.”Ugbu a, ana m agbalị ime ka m bụrụ onye ndị mmadụ maọbụ Chineke ga-anabata? Ka m na-agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ? Nʼihi na a sị na m na-eme ihe na-atọ ndị mmadụ ụtọ, agaraghị m abụ ohu Kraịst.Ma Jisọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ”Ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼakụ mmehie nke ụwa, onye ga-enyekwa ezi akụ nʼaka unu na ntụkwasị obi idebe?Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike