Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jenesis 2:18
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jenesis 2:18
Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.”
N’ọnọdụ ya
15Onyenwe anyị Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya.
16Onyenwe anyị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a,
17ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.”
18Onyenwe anyị Chineke kwuru sị, “Ọ dịghị mma ka nwoke nọrọ naanị ya. Aga m emere ya onye inyeaka nke kwesiri ya.”
19Onyenwe anyị Chineke sitere nʼala kpụọ ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na ụmụ anụ ufe niile nke eluigwe. O dutere ha ka ọ mara ihe mmadụ ahụ ga-akpọ ha. Ihe ọbụla mmadụ ahụ kpọrọ ihe ọbụla ndị a nwere ndụ, nke ahụ bụkwa aha ya.
20Ya mere, mmadụ ahụ nyere anụ ụlọ niile na anụ ufe niile na anụ ọhịa niile aha. Ma nʼebe Adam nọ, o nweghị onye inyeaka kwesiri ya.
21Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya.
N’asụsụ Bekee
The LORD God also said, “It is not good for the man to be alone. I will make for him a suitable helper.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Mmadụ abụọ ka mma karịa otu onye, nʼihi na ha ga-arụpụta ọtụtụ ihe: Otu onye nʼime ha daa, onye nke ọzọ ga-apalite ya. Ma mgbe ọ bụ naanị otu onye, onye ga-apalite ya? Ọ nọ nʼime nsogbu. Ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ abụọ edinakọ, ahụ ga-ekpokwa ha ọkụ, ma olee otu onye naanị ya dina ga-esi nweta okpomọkụ? Ọ bụ ezie na e nwere ike merie onye naanị ya guzo, ma mmadụ abụọ pụrụ iguzo zọọ onwe ha. Ụdọ e ji eriri atọ tụkọta nʼotu, adịghị adọbi ya ngwangwa.Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke. E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke. E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke. Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi. Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke. Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta.Nʼotu aka ahụ, ndị bụ di na-echenụ echiche dị mma banyere nwunye unu, ma nyenụ ha ugwu ruuru ha dịka ndị na-adịghị ike na dịka ndị unu na ha ga-eso keta onyinye amara nke ndụ ahụ. Nke a ga-eme ka ihe ọbụla hapụ igbochi ekpere unu.Nwanyị kwesikwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe. Ekwenyeghị m ka nwanyị zie ihe, maọbụ ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ndị nwoke nọ. Ha kwesiri ịnọ nwayọọ mgbe ọbụla unu zukọrọ. Ọ bụ nʼihi na e buru ụzọ kee Adam tupu e kee Iiv.Otu ụbọchị, Naomi, nne di Rut, gwara ya okwu sị, “Nwa m nwanyị, ọ bụ na o rubeghị mgbe m ga-achọtara gị ụlọ nke aka gị, ebe a ga-anọ lekọtazie gị anya nke ọma?Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii.Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.”Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike