Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ọpụpụ 20:12

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ọpụpụ 20:12

Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

Gụọ isi ahụ dum: Ọpụpụ 20

N’ọnọdụ ya

9Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile.

10Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọbụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị.

11Nʼihi na ọ bụ nʼime ụbọchị isii ka Onyenwe anyị kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri, na ihe niile dị nʼime ha. O zuru ike nʼụbọchị nke asaa. Nʼihi nke a Onyenwe anyị gọziri ụbọchị nke asaa doo ya nsọ, ka ọ bụrụ ụbọchị izuike.

12Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

13Gị egbula mmadụ.

14Gị akwala iko.

15Gị ezula ohi.

Ọpụpụ 20

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleExodus 20:12Honor your father and mother, so that your days may be long in the land that the LORD your God is giving you.

E hotara ya n’Agba Ọhụrụ

Mat 15:4Nʼihi na Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nna maọbụ nne ya ka e gbuo ya. ’
Efe 6:2–3“Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. “Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.”
Mat 19:19Sọpụrụ nne gị na nna gị. Ọzọ, hụkwa onye agbataobi gị nʼanya dị ka onwe gị.’ ”
Mak 7:10Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’ na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’
Mak 10:19Ị maara ihe niile enyere nʼiwu: ‘Egbula mmadụ, a kwala iko, e zula ohi, a gbala ama ụgha, a ghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nne na nna gị.’ ”
Luk 18:20Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị. ”

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Efe 6:1–3Ụmụ, ruberenụ ndị mụrụ unu isi nʼihi na nke a ziri ezi nʼime Onyenwe anyị. “Sọpụrụ nne gị na nna gị,” nʼihi na nke a bụ iwu mbụ nke nwere nkwa so ya. “Ka ihe nwe ike na-agara gị nke ọma, ka ị biekwa ogologo ndụ nʼelu ụwa.”
Kọl 3:20Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
Dit 5:16Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.
Ilu 23:22–25Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị. Zụta eziokwu, erekwala ya, zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta. Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe. Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
Lev 19:3“ ‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
Ilu 30:17“Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
Ilu 1:8–9Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị ahapụkwala ndụmọdụ nne gị. Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị, bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike