Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Jenesis 1:28
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Jenesis 1:28
Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”
N’ọnọdụ ya
25Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
26Mgbe ahụ, Chineke kwuru sị, “Ka anyị mee mmadụ nʼoyiyi anyị, dịka ụdịdị anyị si dị, ka ha chịa azụ niile nke osimiri, na anụ ufe niile nke eluigwe, na anụ ụlọ niile, na anụ ọhịa niile, na ihe niile e kere eke nwere ndụ nke na-akpụ akpụ nʼala.”
27Ya mere, Chineke kere mmadụ nʼoyiyi nke ya, nʼoyiyi Chineke ka o kere ha, nwoke na nwanyị ka o kere ha.
28Chineke gọziri ha sị ha, “Mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ nʼụwa, meenụ ka ihe niile dịrị nʼokpuru unu. Chịanụ azụ niile nke osimiri na anụ ufe niile nke eluigwe na ihe niile e kere dị ndụ nke na-akpụgharị akpụgharị nʼala.”
29Mgbe ahụ, Chineke sịrị “Enyela m unu ahịhịa ubi niile na-amị mkpụrụ dị nʼelu ụwa, na osisi ọbụla mịrị mkpụrụ, nke mkpụrụ ọkụkụ ya dị nʼime ha, ka ha bụrụ ihe oriri gị.
30Ma ụmụ anụmanụ niile na anụ ufe niile, na anụ niile e kere eke na-akpụgharị akpụgharị nʼala, anụ ọbụla nwere ndụ nʼime ha ka m na-enye ahịhịa ndụ niile ka ọ bụrụ ihe oriri ha.”
31Chineke legharịrị anya nʼihe o kere, hụ na ọ dị ezi mma. Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke isii.
N’asụsụ Bekee
God blessed them and said to them, “Be fruitful and multiply, and fill the earth and subdue it; rule over the fish of the sea and the birds of the air and every creature that crawls upon the earth.”Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke gọziri Noa na ụmụ ya sị ha: “Mụọnụ, baanụ, jupụtanụ nʼụwa.Ma unu onwe unu, mịanụ mkpụrụ, mụbaanụ, jupụtanụ ụwa, baakwanụ ụba nʼime ya.”“ ‘Aga m eji ihuọma leta unu, mee ka unu mụbaa ma jupụta nʼọnụọgụgụ. Aga m eme ka ọgbụgba ndụ m nʼebe unu nọ dịgide.Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị.aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha. Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.”Ma banyere Ishmel, anụla m ihe i kwuru. Aga m agọzi ya mee ya ka ọ baa ụba ma dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-aghọ nna ndị eze iri na abụọ. Aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.Abụ nrigo, nke Solomọn. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, nʼefu ka ndị nche na-amụ anya. Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ na-adọgbu onwe gị nʼọrụ ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo. Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye. Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha, otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị. Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya. Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro na-arụrịta ụka nʼama.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike