Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Filipai 3:13
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Filipai 3:13
Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu.
Gụọ isi ahụ dum: Ndị Filipai 3
N’ọnọdụ ya
10Naanị ihe m chọrọ bụ ịmara Kraịst na ike dị na mbilite nʼọnwụ ya, na nnwekọ nke isoro ya keta oke nʼahụhụ ya, nakwa ka m yie ya nʼọnwụ.
11Ka m si otu a, ruo nʼogo nke inweta mbilite site nʼọnwụ.
12Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya.
13Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu.
14Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst.
15Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a.
16Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.
N’asụsụ Bekee
Brothers, I do not consider myself yet to have taken hold of it. But one thing I do: Forgetting what is behind and straining toward what is ahead,Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke.”Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu. Ka anyị na-elegide Jisọs anya, onye mbụ na onye na-eme ka okwukwe anyị zuo oke, onye jiri nʼihi ọṅụ e debere nʼihu ya, die ahụhụ na ihe ihere nke obe, ọ nọdụ nʼaka nri nke ocheeze Chineke.Unu amataghị na mgbe ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ịsọ mpi, ọ bụ naanị otu onye na-enwe ihe onyinye nke mbụ? Ya mere, gbasienụ ọsọ ike, ka unu nweta onyinye ahụ. Ndị na-ejikere ịgba ọsọ maọbụ egwuregwu ọzọ na-enwe ntachiobi nʼọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ha na-azụ onwe ha naanị ka ha nweta okpueze okoko osisi na-emebi emebi. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpueze nke na-apụghị imebi emebi. Ọ bụ nke a mere m ji na-agba ọsọ a na-eleghị anya nʼazụ, maọbụ kụọ ọkpọ dịka m na-akụ ifufe. Ma ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ mee ya ka ọ bụrụ ohu, ka mụ onwe m ghara ị bụ onye a jụrụ ajụ mgbe m kwusasịrị oziọma nye ndị ọzọ.Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị ụbọchị niile nke ndụ m, na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.E, karịa nke a, akpọọla m ihe ndị a niile ihe efu, nʼihi na a pụghị iji ha tụnyere ịdị oke ọnụahịa nke ịmata Kraịst Jisọs, Onyenwe m. Nʼihi ya, etufuola m ihe ndị a niile, gụọ ha dị ka ihe na-abaghị uru, ka m nwee ike rite Kraịst nʼuru.Ya bụ ka anyị na-aga nʼihu nʼihe mmụta zuru ezu, ka anyị gharakwa ịnọgide nʼihe mmụta mbụ ahụ nke anyị nwere banyere Kraịst. Anyị agaghị alaghachi azụ ịtọ ntọala nchegharị ọzọ site nʼọrụ ndị nwụrụ anwụ nʼokwukwe nʼebe Chineke nọ,Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike