Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ndị Kọlọsị 3:8
Amaokwu Baịbụl · IGCB
Ndị Kọlọsị 3:8
Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta.
N’ọnọdụ ya
5Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).
6Ọ bụkwa nʼihi ihe ndị a ka ọnụma Chineke na-abịakwasị ndị ahụ na-enupu isi.
7Ihe ndị a bụ ihe unu na-eme nʼoge gara aga mgbe unu na-adị ndụ nʼime ha.
8Ma ugbu a bụ oge iwezuga ihe ndị a niile na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu niile, ya na okwu ihere niile na-esi unu nʼọnụ na-apụta.
9Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nʼihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a.
10Ugbu a, unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke e ji amamihe na-eme ka ọ dị ọhụrụ nʼoyiyi nke onye kere ya.
11Nkewa ọbụla adịghị nʼime ndụ a. Ọ dịghị mkpa maọbụ onye Juu maọbụ onye mba ọzọ, maọbụ onye e biri ugwu, maọbụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa maọbụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bu onye ime ọhịa, maọbụ onye Sitia, maọbụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ na Kraịst bụ ihe niile, nọrọkwa nʼime ihe niile.
N’asụsụ Bekee
But now you must put aside all such things as these: anger, rage, malice, slander, and filthy language from your lips.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị.Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile,Nʼihi na iwe nke mmadụ anaghị arụpụta ezi omume nke Chineke. Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ niile na ihe ọbụla dị njọ nke fọdụrụ nʼime ndụ unu. Ma jirinụ obi umeala nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nʼobi unu, nke nwere ike ịzọpụta mkpụrụobi unu.Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele.Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe.Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu. Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike