Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › 2 Ndị Kọrint 9:7
Amaokwu Baịbụl · IGCB
2 Ndị Kọrint 9:7
Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya.
Gụọ isi ahụ dum: 2 Ndị Kọrint 9
N’ọnọdụ ya
4Nʼihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị na-anya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụrụ m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere ntụkwasị obi na unu ga-anọ na njikere.
5Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere na nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nʼihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nʼihi na a gwara unu ka unu nye.
6Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne.
7Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya.
8Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.
9Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.”
10Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.
N’asụsụ Bekee
Each one should give what he has decided in his heart to give, not out of regret or compulsion. For God loves a cheerful giver.Ntụaka
Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.
Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.Nʼihe niile, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka, site nʼịrụ ọrụ nʼụzọ dị otu a, na-echetara m okwu nke Onyenwe anyị Jisọs kwuru sị, ‘Ngọzị karịrị dị nʼinye enye karịa ịnara anara.’ ”Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha.“Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a.E, onye na-agbasa aka ya ga-aba ọgaranya; onye ọbụla na-atụte ndị ọzọ ka a ga-atụtekwa.Ma mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye gị, a sị na e nwee onye ogbenye nʼetiti gị, nke bụ onye Izrel ibe gị, ị gaghị emechi obi gị maọbụ kechie aka gị megide ya, ị ghaghị ịgbazinye ya ihe dị ka o si chọọ. Lezie anya ka ị ghara inwe ụdị echiche ọjọọ a nʼobi gị sị, “Afọ mgbaghara ụgwọ na-abịa nso,” nʼihi ya, i kechie obi gị jụ ibinye nwanna gị nọ na mkpa ihe ọ chọrọ. Ọ bụrụ na onye ahụ nọ na mkpa akwaa akwa kpọkuo Onyenwe anyị, a ga-agụ gị dịka onye ikpe mmehie mara. Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya. A ghaghị inwe ndị ogbenye nʼetiti unu, ọ bụ ya mere iwu a jiri dị mkpa. Gbasapụ aka nʼebe nwanna gị na nʼebe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa nọ.Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.Jirinụ obiọma na-elerịta ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọbụla.Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike