Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Ekiliziastis 3:1–8

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Ekiliziastis 3:1–8

1Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.

2Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu,

3oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,

4oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu,

5oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,

6oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi,

7oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,

8oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo.

Gụọ isi ahụ dum: Ekiliziastis 3

N’ọnọdụ ya

1Ihe ọbụla nwere oge; mgbe dịkwara ihe ọbụla a na-eme eme nʼeluigwe.

2Oge ịmụ nwa na oge ịnwụ anwụ, oge ịkụ ihe na oge ihopu,

3oge igbu egbu; na oge ịgwọ ọrịa, oge itikpọ na oge iwuzi ewuzi,

4oge ịkwa akwa, na oge ịchị ọchị, oge iru ụjụ na oge ite egwu,

5oge ikposa nkume na oge ịchịkọta nkume, oge ịbakụ na oge ịkwụsị ịbakụ,

6oge ịchọ ihe, na oge ntufu, oge ịchịkọba, na oge ichifusi,

7oge ndọwasị, na oge ndụkọta, oge ịgba nkịtị, na oge ikwu okwu,

8oge ịhụnanya na oge ịkpọ asị, oge ibu agha, na oge ime udo.

9Gịnị bụ nnọọ ihe mmadụ na-enweta site na ndọgbu niile nke nʼọrụ niile ọ na-arụ?

10Ahụla m ibu arọ nke Chineke bokwasịrị ndị mmadụ e kere eke.

11O meela ka ihe niile maa mma nʼoge nke ya. O tinyekwala ebighị ebi nʼime obi ndị mmadụ; ma o nweghị ka mmadụ ghọta ọrụ Chineke site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ.

Ekiliziastis 3

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleEcclesiastes 3:1–8To everything there is a season, and a time for every purpose under heaven: a time to be born and a time to die, a time to plant and a time to uproot, a time to kill and a time to heal, a time to break down and a time to build, a time to weep and a time to laugh, a time to mourn and a time to dance, a time to cast away stones and a time to gather stones together, a time to embrace and a time to refrain from embracing, a time to search and a time to count as lost, a time to keep and a time to discard, a time to tear and a time to mend, a time to be silent and a time to speak, a time to love and a time to hate, a time for war and a time for peace.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Ekl 3:17A gwara m onwe m, “Chineke ga-ekpe, ndị ezi omume na ndị ajọ omume ikpe, nʼihi na a ga-enwe oge maka ihe ọbụla a na-eme eme, oge dịkwa maka ikpe ọrụ niile nke mmadụ ikpe.”
Mat 16:3Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara.
Ekl 8:5–6Onye na-edebe iwu eze agaghị adaba na nsogbu. Onye maara ihe na-ama mgbe kwesiri na ụzọ kwesiri ime ihe. Ihe niile nwere oge kwesiri ya, ụzọ e si eme ha dịkwa, ọ bụ ezie na nsogbu mmadụ dị ukwuu nʼahụ ya.
Ekl 7:14Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma, ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọma na Chineke onye na-enye ọnọdụ ọma makwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ. Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụta ọdịnihu ya.
2Ez 5:26Mgbe ahụ Ịlaisha zara ya, “Ọ bụ na mmụọ m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ya rịdata izute gị? Oge a ọ bụ oge ịnara ego, na ịnara uwe, na ịnara ubi oliv, na ubi vaịnị, na igwe ehi, na igwe atụrụ, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom na-eje ozi?
Ilu 15:23Ọṅụ na-adị mgbe mmadụ natara ọsịsa dị mma, okwu e kwuru nʼoge o kwesiri dị mma.
2Ih 33:12Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka Onyenwe anyị Chineke nna nna ya.
Ekl 2:3Echere m nʼobi ụtọ m ga-esite nʼịṅụ mmanya. Agbasokwara m ụzọ ibi ndụ nzuzu ma obi m nọ nnọọ na-edu m site nʼamamihe. Olileanya m bụ na m ga-esi otu a chọta ụzọ kachasị mma ndị mmadụ nwere ike iji bie mkpụmkpụ ndụ ha nʼụwa.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike