Bible Explorer Nweta ngwa

Ụlọ › Amaokwu Baịbụl a ma ama › Aịzaya 40:31

Amaokwu Baịbụl · IGCB

Aịzaya 40:31

ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

Gụọ isi ahụ dum: Aịzaya 40

N’ọnọdụ ya

28Ọ bụ na ị matabeghị? Ọ ga-abụ na ị nụbeghị ya? Onyenwe anyị bụ Chineke nke mgbe niile ebighị ebi, Onye kere nsọtụ niile nke ụwa. Ọ naghị ada mba; ike adịghịkwa agwụ ya. O nwekwaghị onye pụrụ ịmata ịdị omimi nke nghọta ya.

29Ọ na-enye ndị na-ada mba ike, na-emekwa ka ndị na-enweghị ume nwee ume.

30Ọ bụladị ụmụ okorobịa na-ada mba, ike na-agwụkwa ha. E, ụmụ okorobịa na-asọ ngọngọ daa,

31ma ndị niile olileanya ha dị na Onyenwe anyị, ga-agbanwe ike ha, nweta ike ọhụrụ. Ha ga-eji nku felie elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha; ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.

Aịzaya 40

N’asụsụ Bekee

Berean Standard BibleIsaiah 40:31But those who wait upon the LORD will renew their strength; they will mount up with wings like eagles; they will run and not grow weary, they will walk and not faint.

Ntụaka

Akụkụ ndị na-agụ na-ejikọkarị na nke a.

Akw 3:25–26Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike. Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
2Kọ 4:16Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.
Abụ 27:13–14Olileanya m bụ nke a: Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị nʼala ndị dị ndụ. Chere Onyenwe anyị; dịrị ike, nwekwaa ume, ma chere Onyenwe anyị.
Abụ 103:5onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.
2Kọ 12:9–10Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.
Hib 12:1Ya mere, anyị nwere oke igwe ndị ama dị otu a gbara anyị gburugburu, nʼihi nke a, ka anyị wepụ ihe ọbụla nke na-adọghachi anyị azụ dịka ibu arọ, ya na mmehie niile nọdebere anyị nsọ karịa. Ka anyị werekwa ntachiobi gbaa ọsọ nke chere anyị nʼihu.
Gal 6:9Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nʼihi na mgbe e mesiri, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzị dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
Rom 8:25Ma ọ bụrụ na olileanya anyị dabeere nʼihe ahụ anyị na-enwetabeghị, anyị ga-eji ndidi chere tutu ihe ahụ erute anyị aka.

Isi mmalite: OpenBible.info, CC BY 4.0 · Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a · © 2020 Biblica, Inc., CC BY-SA 4.0; changed: footnotes, headings and the letters over Psalm 119 left out, verses in the app's numbering. The original work by Biblica, Inc. is available for free at www.biblica.com and open.bible. · Isi mmalite na ikike